Anambra APC enweghịzị onyeisioche?
Anambra APC enweghịzị onyeisioche?

Ebe foto si, Uche Akolisa
Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile
Ụlọikpe ukwu nọ n'Awka akagbuola ọnọdụ onyeisioche APC n'Anambra steeti bụ Emeka Ibe.
Cheta n'Uzochukwu Onyekwere bụ onye ya na Ibe zọrọ ọkwa ahụ gara ụlọikpe ka ha mechere ntụlịaka ahụ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Mee.
Deji Adeyanjụ ekurula nwaume n'aka ndị ụlọikpe
Ebe foto si, Deji Adeyanju/Twitter
Ndị uweojii jidere Deji Adeyanju ebe ọ na-edu ngagharị iwe buso gọọmentị Naịjirịa
N'aka ọzọ, ụlọikpe nta dị n'Abuja atọpụla Deji Adeyanjụ bụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye, a kpọchiri maka ịkpọrị osote onyeisiala bụ Yemi Osibajo na soshal midia.
Nwata Nna ya tara ahụhụ maka imesi ibe ya ike
Ebe foto si, Matt Cox/Facebook
Kirsten Cox ji ụkwụ aga akwụkwọ ebe nna ya ji ụgbọala eso ya n'azụ
N'ofesi, otu nwoke atala nwa ya nwaanyị ahụhụ iji ụkwụ ga maịlị ise maka imegbu ụmụaka ibe ya n'ụgbọala ha ji aga akwụkwọ.
Matt Cox tara Kirsten ahụhụ maka isi ike ya n'ụgbọala ụlọakwụkwọ bụ ndị sị na ọgaghị abakwa ụgbọala ụmụakwụkwọ abalị atọ.
Ihe mere Ụgbọele Vichai Srivaddhanaprabha ji kụrịe
Ebe foto si, Getty Images
Ụgbọelụ helikọpta Vichai Srivaddhanaprabha,
N'egwuruegwu, ndị ọrụ nyọcha ihe mberede ụgbọelu a kpọrọ Air Accident Investigation Branch nke mba Briten,ekwuola na o nwere ihe kwopụrụ isi n'ụgbọelụ helikọpta nke onye nwe otu egwu Leicester City nwụrụ na ya.
Vichai so na ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu mere n'ọnwa Oktoba, afọ a.
Gee Nkeji anyị ebe a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị tata
Christmas sales: Egwuọma na egwu iwe na-akụ