Female Condoms: Ihe mere ụmụnwaanyị anaghị egbochi ịtụrụ ime

Okpu nnabụenyi na ọgwụ mgbochi ịtụrụ ime Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Okpu nnabụenyi na ọgwụ mgbochi ịtụrụ ime

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nhazi ọmụmụ n'ezinaụlọ na Naịjirịa etiela oke mkpu na ndị mmadụ anaghị eso atụmatụ mgbochi ịtụrụ ime.

N'ọgbakọ ha mere n'Abuja ebe otu onye n'ime kwuru na ọ chọpụtara na pasenti iri asatọ n'ime ụmụagbọghọ na Naịjirịa anaghị aṅụ ọgwụ ndị a.

Onye ọkachamara aha ya bụ Dọkịta Nike Jagun gwara BBC Igbo na ụfọdụ ihe na-akpata ụmụnwaanyị anaghị eji ọgwụ mgbochi ime bụ n'ihi nke a;

  • Ụmụnwaanyị Naịjirịa hụrụ ịmụ nwa n'anya nke ukwu ya mere ọtụtụ ha a naghị eji ihe mgbochi ịtụrụ ime.
  • Ọtụtụ ezinaụlọ amaghị ihe bụ nhazi ezinaụlọ na uru ọ bara, ya mere ha anaghị agbaso usoro ndị a.
  • Ihe ọghọm mere ụfọdụ ndị ṅụrụ ọgwụ ndị a na-etinye ụjọ n'ime ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ghara ịgbaso usoro mgbochi ịtụrụ ime.

Jagun kwuru na onye ọbụla nwere usoro nke ahụ ya na-anabata ma nwee kwa ndị ahụike tozuru oke ga-enye onye ahụ usoro ịṅụ ọgwụ ndị a.

O kwuru na ọ bụghị onye ọrụ ahụike ọbụla nwere amamihe etu esi agbaso usoro ịnụ ọgwụ mgbochi ndị a.

Jagun kwuru na ụfọdụ ihe ọghọm dị na ịgbaso usoro ndị a gụnyere nwaanyị ịgba oke ọbara site site n'ihe o ji bụrụ nwaanyị.

Ụfọdụ usoro mgbochi itụrụ ime ndị a gbapụtara ihe:

Image copyright Getty Images
  • Okpunnabuenyi (Condom) - nke nwoke na nke nwaanyị.
  • Mkpụrụ ọgwụ ọṅụṅụ.
  • Ọgwụ ana-etinye n'aka.
  • Ndị nkw a na-etinye n'akpa nwa (Intrauterine devices) na echetera m echeyaghị m.

BBC Igbo gbara ụfọ ụmụnwaanyị ajụjụ banyere ihe mere ha anaghị aṅụ ọgwụ mgbochi ịtụrụ ime.

Otu nwaaghọghọ aha ya bụ Amara kwuru na ụfọdụ ụmụnwaanyị na-eji ihe mgbochi dịka okpunnabuenyi ebe ndị ọzọ anaghị eji.

O kwuru na ha kwenyere na iji okpunnabuenyi na-eme ka ha ghara ịnụ ụtọ mmekọrịta ha na nwoke.

O kwukwara na ụfọdụ ndị nke na-agba akwụna anaghị eji okpunnabuenyi n'ihi nnukwu ego ndị nwoke ha na-enwete n'enye ha na ma ha ghara iyi okpunnabuenyi.

Nkenke aha onyonyo Okpunabuihe so n'otu ihe eji igbochi ịtụrụ ime nakwa ibute ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị

Amara kwuru na nke ọzọ bụ amaghị ihe maọbụ ogbenye nke bụ na ọtụtụ ụmụwaanyị amaghị maka ụzọ mgbochi ime ebe ndị ọzọ na-achọ ka ha nwete ego, ma ha e chefuo iyi okpunnabuenyi.

Nwaanyị ọzọ bụ Oriaku Chukwuemeka Kwuru na ọ bụ maka ihe ọghọm dị n'ịṅụ ya bụ ọgwụ mere ndị mmadụ anaghị ekwe aṅụ.

Oriaku Chukwuemeka bụ onye lụrụla di kwuru na ọrịara ezigbo ọrịa mgbe ọ ṅụrụ ọgwụ ahụ nke mere oji kwụsị ya ịṅụ ọgwụ ndị a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị achọ iyi okpunnabuenyi nakwa ka nwunye maọbụ nwaanyị ha ṅụọ ọgwụ ndị a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke