N800b subsidy debt: Gọọmentị ejigbuola anyị n'ụgwọ - Ndị ahịa mmanụ

Akụkọ dị mkpa

Ndị ahịa mmanụ ụgbọala na Gọọmentị

Image copyright Getty Images

Ndị na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na onweghi nkwerikọta ọbụla ha na gọọmentị nwere banyere ụgwọ ego dị ijeri narị naịra asatọ e ji ha.

Onye odeakwụkwọ ha bụ Olufemi Adewole kwuru na ha ka kwụ ebe ha kwụ bụ ịkwụsị ọrụ dịka ụbọchị asaa ha nyere gọọmentị na-abịa n'ozuzu.

Mbaka arịọla Peter Obi

Image copyright Getty Images/REV,Fr EJIKE MBAKA Facebook Pg

Soshial Midia na-enwu ọkụ n'okwu banyere arịrịo Fada Ejike rịọrọ Peter Obi n'okwu ọ gwara ya n'ịzuụka gara aga.

Ọtụtụ kwuru na Mbaka e gosila ihe o ji bụrụ ezigbo nwa Chineke ebe ndị ọzị na-ekwu na okwu ya bụ ihe ihere nye ụka Katọlik.

N'ofesi

Image copyright AFP

Osote mịnịsta ọdịnala na mba Fransị bụ Laurent Nunez ekwuola na ihe ruru mmadụ puku iri atọ na otu esonyela na ndị ye akwa odo odo na-eme nghagharị iwe na mba ahụ.

Ngagharị iwe a nke bụ maka mbuli ọnụ mmanụ ụgbọala ka na aga n'ihu n'agbanyeghi na gọọmentị mba Fransị akwụsịtụla ya rue ọnwa isii.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohamed Salah nyerela Liverpool goolu 44 n'afọ 2017/2018

Mohamed Salah na-enwu ọkụ dịka ọ bụ ya kachasị e nye goolu n'asompi dị na mba Yurope kamgbe otu afọ ma a gụpụ Lionel Messi.

Salah nyere goolu atọ na mmeri Liverpool ji ọkpụ goolu anọ merie Bournamouth n'asọmpi Premier lig.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBody Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada

Ọkụ abaala ụlọahịa na Kaduna

Image copyright Kaduna State Emergency Management Agency

Ọkụ ataala ọtụtụ ụlọ ahịa a na-ere redio, TV na ngawa ahịa "electronic" ọzọ n'ụzọ Ahmadu Bello Way dị na Kaduna, isi obodo Kaduna steeti.

A na-eche na ọkụ a bidoro n'otu ụlọ ahịa n'elekere iri nke abalị Fraịde, ree ọtụtụ ụlọahịa.

Ahmadu Bello Way bụ ebe ọtụtụ ụlọahịa dị na Kaduna.

Ndị ọrụ gbata gbata na Kaduna dere n'akara Facebook ha na ha gaara ebe a ọku a gbara ịgbanyụ yainye.

Opec enwela nkwekọrịta nchabi mman agbịdị

Image copyright Getty Images

Opec, bụ ọgbakọ mba ndị na-emepụta mmanụ, achabiela oke mmanụ ha ga na-emepụta.

Mba iri ọzọ na-emepụta mmanụ na-anọghi n'otu ahụ so nwe nkwekọrịta na a ga-achabi mmepụta agbọ mmanụ otude na narị ise kwa ụbọchị.

Ebumnobi ha bụ na ọ ga-eme ka ego a na-ere mmanụ belata ọdịda ọ na-ada.

Azọgbuola mmadụ isii na Itali

Image copyright Vigili del Fuoco

Ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ azọgbuola mmadụ isii n'ebe a na akwọrị akụ n'obodo Ancona dị n'Itali.

Ebe mmadụ otu narị ọzọ merụrụ ahụ, nke mmadụ iri n'ime ha merụru ezigbote ahụ.

Mberede a mere ka awaụru ose ebe ndi a nọ.

N'egwuregwu,

Image copyright NFF

Taa ka ndị Super Falcons ga-amata ndị ha na ha ga ezute n'asọmpị Iko Mbaụwa nke ụmụnwanyị a ga-agba n'afọ 2019.

Falcons ritere ohere ịga iko Mbaụwa a ka ha turu ugo n'iko mba Afrịka nke ụmụwanyị a gbara n'Accra, isi obodo Ghana.

Gee akụkọ ndị a n'ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile