Father Mbaka: Ihe mere okwu ya ji akpata ụka

Fada Ejike Mbaka Image copyright adorationministryenugu.org.ng

Kemgbe e chiri ya ụkọchukwu na 1995, ọnwa Julaị 29, afọ 1995, Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu sitere n'ụtụtụ puo eze.

Bido n'ụlọụka Holy Ghost Cathedral bụ ebe mbụ e zigara ya ọrụ, Mbaka bidoro na-adọta igwe mmadụ n'ụka ụtụtụ n'ihi ka oziọma ya sị ada.

Na e gbughị oge aha ya wusara ebe niile n'ala Igbo dịka akụkọ ọrụebube so ofufe nro ya "Adoration Ministry" na-agbasasị.

Mana ihe ndị mere Mbaka onye ama ama na gburugburu Naijiria bụ okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị o kwurula n'elu ebe nchụaja.

Ọtụtụ n'ime amụma ahụ nke ọ na-ebu na mịnịstri ya nke na-adọta puku kwuru puku mmadụ kwa izuụka, ebe ụfọdụ emezughị.

Image copyright MBuhari Twitter
Nkenke aha onyonyo Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016 díka

Lee ụfọdụ okwu Mbaka kwurula pụtara ụka na Naijiria:

1. N'ụbọchị Mọnde, December 2, 2018, Mbaka gwara Peter Obi, onye so Atiku Abubakar azọ dịka Osote Onyeisiala na Chineke kpọrọ aka ntachi asị n'ihi na Obi jụrụ ịkpọpụta aha ego ọ ga-enye maka ịrụ ọrụ na mịnịstrị Mbaka.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ Mbaka na-ajụ ma ọ na-eke ngọzị Chukwu naanị ndị wetara ego mana na nzaghachi ndị katọrọ ya, Mbaka kwuru sị, "Anaghị m ana ego ikpere onye ọbụla ekpere."

2. N'ọnwa Oktoba, Mbaka kpọrọ Atiku 'Bureau de change' n'ihi ụdị ego igwe akụkọ kwuru banyere ndị mmadụ n'aka n'oge PDP meriri na ntuliaka imeụlọ ha na Pọt Hakọt.

Image copyright Getty Images

3. Na 2015, Mbaka buru amụma na Goodluck Jonathan agaghị emeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ ahụ n'ihi na Chineke ajụla ya, kama na Buhari ga-emeri.

Amụma ya ahụ adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma ọkachasị Ndigbo n'ihi ịhụnannya ha nwere n'ebe Jonathan nọ, mana Buhari mechara merie.

4. N'ọnwa Janụwarị nakwa Oktoba afọ 2018, ka o gachara ihe dịka afọ atọ ọ batara ọchịchị, Fada Mbaka kwuru n'ozioma ya, sị,"Buhari gbanwee maọbụ a gbanwe gị"

Okwu butekwara ụka n'ihi na ọtụtụ nọ na soshal midia tara ya ụta sị na ọ bụ nkwado ya mere ka Buhari banye n'ọchịchị.

Image copyright Ikedi Okahim/Facebook

5. N'afọ 2014, Mbaka gwara ndị Imo ka ha ghara ịtụnyere Ikedi Okahim ịzọ ọkwa nke abụọ dịka Gọvanọ Imo maka iti ụkọchukwu ihe.

Ohakim kpụrụ afọ n'ala na ntuliaka ahụ. Mana e mechara, Mbaka rịọ mgbaghara sị na ọ bụ asị ka a tụdoro Ohakim.

6. N'afọ 2003, Mbaka kwuru na Chimamaroke Nnamanị, onye bụbu gọvanọ Enugwu steeti agaghị abanye ọkwa ọchịchị agba nke abụọ.

Amụma ahụ emezụghị mana n'otu mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: