Action Alliance: Ọ bụ Uche Nwosu ka anyị ma - Obidiche

Udeze Kenneth Obidiche na Uche Nwosu Image copyright Udeze Kenneth Obidiche/Facebook na BBC

N'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara onye ọkaiwu Kenneth Obidiche, o kwuru na ọ bụ ya bụ ezigbo onyeisioche pati Action Alliance (AA) na ọ bụghị Tunde Anifowose-Kelani.

Nke a bụ na nzaghachị okwu pụtara n'ihe akwụkwọ akụkọ na Tunde Anifowose-Kelani ajụla ịnabata Uche Nwosu dịka onye ji aha AA azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti.

O kwuru na Anifowose-Kelani ji ọkwa ahụ site n'afọ 2013 rue 2017, mana ọ na-apụrụ ya ọkwa n'ọnwa Apurelu mgbe ha mechara ọgbakọ pati ha.

Obidiche kwuru na ọ bụ aha nke ya dị n'akwụkwọ ụlọọrụ INEC dịka onyeisioche pati Action Alliance.

Obidiche kwuru na ọ bụ Uche Nwosu bụ onye pati AA nabatara iji aha ya azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Uche Nwosu

N'okwu ya; "Ọnọdụ m dịka onyeisioche Action Alliance dịka okwute zayọn, onweghi onye na-akwa ya aka."

Mgbe BBC Igbo kpọrọ FCC Jones bụ onye odeakwụkwọ mgbasa ozi Uche Nwosu, o kwuru na Anifowose-Kelani abụghị onyeisioche pati AA kama na ọ bụ Kenneth Obidiche.

Jones kwuru na Anifowose-Kelani ji aha onyeisioche na-eduhie ndị mmadụ. Na ọ bụ ndị na-emegide Uche Nwosu na-akpa nkata ọjọọ ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na onweghi nkewa ọbụla dị n'etiti Action Alliance, na ọ bụ ndị na-atụ ụjọ na Uche Nwosu ga-emeri n'Imo Steeti na-ekwu nke ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: