Electoral Act: Buhari na-eme ihe PDP mere na 2015 - Dr Mcginger

Mohammadu Buhari Image copyright Getty Images

Ka o si kwụrụ ugbua, iwu ọhụru nke akpọrọ "Electoral Act Amendment Bill" na Bekee agaghị abụ iwu ga-ejikọ ntuliaka Naịjirịa n'afọ 2019.

Nke a bụ makana Onyeisiala Muhammadu Buhari nyeahachịrị ya ndị omeiwu na-ebinyeghi aka na ya.

Nke a bụ ugboro anọ Buhri jụrụ ibinye aka n'iwu a.

Buhari sị na ihe mere ya ejighi binye aka n'iwu a bụ maka na onwere ebe edochaghị ya anya etu ndi omeiwu si dee ya bụ iwu.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na e me iwu a ugbua, na ọ ga-enye nsogbu makana ntuliaka nke 2019 adịla nso, nke mere na onwereike gbagwojuo ndị mmadụ anya.

N'agbanyeghi ihe Buhari kwuru maka ihe mere o ji mee ihe a, ọtụtụ mmadụ sị na ọ bụghị ezi obi ka o ji mee ihe a.

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ihe na-eme n'obodo bụ Dọkinta Mcginer Ibeneme gwara BBC na ihe Buhari mere gosiri na ọ chọghị ime ntuliaka nke 2019 etu ziri ezi.

Dọnkinta Ibeneme gakwara n'ihu kwuo na ụdịrị ihe a Buhari na pati ya bụ APC na-eme ugbua bụ ụdịrị ihe PDP mere na ntuliaka nke 2015.

Gee Ibeneme ntị ebe a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Dr Ibeneme gwara BBC maka 'Electoral Act'

N'otu okwu ahụ, ọnu na-ekwuru APC na Legọs Steeti bụ Joe Igbokwe gwara BBC na obi Buhari dị ọcha mgbe ọ jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ iwu a.

Igbokwe sị na onwere ihe Onyeisiala hụrụ n'iwu ahụ mere o jiri sị ka edegharịa ya.

Ọ gakwara n'ihu katọọ PDP, si na ndị mmadụ ekwesighi ige ha ntị.

Lee ihe okwuru.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Joe Igbokwe kwuru maka 'Electoral Act'

Akụkọ ka na-abịa.