Fake News: Onweghi mgbe m sịrị na Buhari agaghị a sụlị Fulani - Lai Mohammed

Akụkọ dị mkpa

Lai Mohammed agọrọla aka ya

Image copyright Getty Images

Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed agọọla na onweghi ebe ọbụla na mgbe ọbụla o kwuru na onyeisiala Buhari agaghị asụli asụsụ obodo ya bụ Fulani.

Nke a bụ na nzaghachị akụkọ n'efegharị na o sịrị na Buhari agaghị asụlị asụsụ ha n'ihi nsogbu o nwere oge awarachara ụbụrụisi na mba ofesi.

Mohammed gwara BBC Pidgin na ọ nọghị na Naịjirịa kamgbe, na kezie oge ọ nọ kwuo ya bụ okwu. Ọ kpọọrọ nke a akụkọ ụgha ma kwuo na ọ bụ ndị iro APC na-atụ asị a.

Okorocha adọọla Ohanaeze Ndigbo aka na ntị

Image copyright BBC Igbo
Nkenke aha onyonyo Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo

Gọvanọ Okorocha nke Imo steet adọọla Ohanaeze Ndigbo aka na ntị ka ha ghara ịdọnyere onye ọbụla ukwu na ntuliaka afọ 2019 kama ka ha mee ka Ndigbo niile dị n'otu.

Ozi a si n'aka onye odeakwụkwọ ya bụ Sam Onwuemeodo mgbe ndị na-ahazi emume ncheta ụbọchị Ndigbo kpọtụrụa n'Owere.

Boko Haram egbuola ndịagha Naịjirịa ọzọ

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndịagha Naịjirịa nọ ọrụ nchekwa na-ibuso ndị Boko Haram agha na ọwụwa anyanwu nke ugwu Naịjirịa

Ndị agha Naịjirịa abụọ ọzọ anwụọla dịka ngalaba Boko Haram nke Abubakar Shekau bụ onyeisi ha wakporo ogige ndịagha dị na Gulumba nke Bama, Borno Steeti.

Otu onye agha gwara ndị ntaakụkọ na ndị a ji ogbunigwe na gbagbu onwe nakwa ngwa agha ndịọzọ wakpoo ha n'oge abalị ụbọchị Satọde.

Na mba ọzọ

Gọvanọ nke Al-Qadarif Steeti dị na mba Sudan bụ Mirghani Saleh na mmadụ anọ ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu Helikọpta.

A chọpụtabeghi ihe butere mkpọkasị ụgbọelu a mere na mpaghara ọwụwanyanwụ nke Sudan.

N'egwuregwu

Image copyright EPA

Onye na-agbara Manchester City bọọlụ bụ Raheem Sterling ekwuola na ndị na-ede akwụkwọ ntaakụkọ na-enye aka n'ịkwado ịkpa oke agbụrụ site n'ụzọ ha ji egosi ndị isi ojii na-agba bọọlụ.

A kpasoro Sterling oke agbụrụ a n'asọmpi Manchester City na Chelsea gbara.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPalm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma

Ụgwọ ndị mmanụ ụgbọala

Image copyright Getty Images

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-akwụ ndị ahịa mmanụ ụgbọala na nke agbịdị, ijeri naịra narị abụọ na iri atọ na isii n'izu a, nke bụ oke n'ime ijeri naịra narị atọ na iri anọ na asatọ e ji ha maka ụgwọ enyemaka.

Henry Ikem-Obih bụ onyeisi nlekọta ọrụ na NNPC Downstream, kwuputere nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Satọde, Disemba 8, 2018.

O kwukwara na n'agbaneyghi na ndị ahịa mmanụ ji gọọmentị ụfọdụ ụgwọ, na agaghị amịpụ ya n'ụgwọ mbụ a gọọmentị ga-akwụ ha.

Ikem-Obih kwukwara na gọọmentị ga-akwụ oke ọzọ n'ime ụgwọ a n'afọ 2019, ma kwụchazie ya n'afọ 2020.

Cheta na ndị na-ere mmanụ kwuru na Gọọmentị ejigbuola ha n'ụgwọ nso nso a.

A kpọchiri ọbaego Peter Obi?

Ọnụ na-ekwuchitere Peter Obi bụ Val Obienyem, gwara BBC Igbo na ha amaghị ihe mere e ji kpachie ọbaego onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala PDP, ma kwuo na ha na-eche ịnụ ihe onyeisiala nwere ikwu

gbasara ya tupu ha amara ihe ha ga-eme.

Image copyright Getty Images

Mana otu na-ahụ maka nyocha mpụ na nrụrụaka bụ EFCC, agọrọla ụkwụ ha na aka ha, na ha amaghị maka ya.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A kpọchiri ọbaego Peter Obi n'ezie - Val Obienyem

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na John Kelly bụ onyeisi ndị ọrụ gọọmentị ya, ga-awụsa ọwa na ngwụcha afọ a.

Image copyright Reuters

Ọpụpụ Kelly ga-eme ya mmadụ iri abụọ na asatọ so Trump bido ọrụ na-apụ n'ọrụ n'ime afọ abụọ ọ bụrụla onyeisiala.

N'egwuregwu,

Mmeri Tottenham meriri otu Leicester City emeela ka ha nọrọ n'ọkwa nke atọ na tebulu Premier League.

Ebe Chelsea meriri Manchester City si n'ọkwa mbụ gbadata n'ọkwa abụọ, nọ n'ọkwa nke anọ na ya bụ tebulu.

Akụkọ BBC na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ndị na-eji igwe akpụ ụzụ gwara BBC na ha anaghị eji akpụobi ha achọ okwu, na ha na-eme ya ka ha nwee ike "tọọ ụtọ" n'anya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBody Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada