Uweojii na-enyocha mwakpo Fada Mbaka - Amaraizu

Akụkọ dị mkpa:

Mwakpo Fada Mbaka

Image copyright Ebere Amaraizu/Adoration Ministry/Facebook

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu ekwuola na ndị uweojii amalitela nyocha banyere mwakpo a sị na e mere Fada Mbaka.

Amaraizu gwara BBC Igbo na ha natara mkpesa si n'aka onye ụkọchukwu a nke mere ya na kọmishịọna ndị uweojii nke Enugwu Steeti bụ Malam Muhammed gara kpọtụrụ Fada Mbaka n'ụlọ ya taa.

Amaraizu sị na Mbaka kwuru na mwakpo a mere na "Naira Triangle" dị nso na Mega nke Enugwu Steeti.

Amnesty International

Image copyright Huw Evans picture agency
Nkenke aha onyonyo Ndị awakporo be ha na Borno n'afọ 2015

Otu Amnesty international enyeela Ulọikpe Mbaụwa bụ ICC iwu ka nyochaa n'ozuzu mpụ na arụ niile e merela n'ibu agha megide Boko Haram.

Otu a bokwara Naịjirịa ebubo na ha maara afọ n'ala n'ikpe ndị aka ha dị n'aya ikpe ziri ezi.

N'ofesi

Image copyright HOC

Praịm minista mba Briten bụ Theresa May akagbuola ntuliaka ekwesiri ime iche maka nkwekọrịta 'Brexit' n'ihi na ọtụtụ ndị ga-ajụ ya.

May kwuru na o kwesiri ike na ọ ga-enwete nkwerịkọta ahụ ma o leba anya na ihe bụ nsogbu ndị a.]

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Cristiano Ronaldo na-agbara Juventus bọọlụ agwala ogbo ya bụ Lionel Messi ka ọ hapụ mba ịgba bọọlụ na Spen bịa n'Itali ka anyị chịpụ ya.

Ronaldo hapụrụ otu egwu Real Madrid nke mba Spen ma gawa Juventus n'afọ a. Ma cheta na mmadụ abụọ ndị a bụ ndị a na-eche na ha kachasị agba bọọlụ na Mbaụwa niile.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnewi: Omenaala Umudim bukọtara obodo 14 dị n'ime ya

Obasanjo

Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo, akatọọla etu ụfọdụ ndị ntaakụkọ si kwugharịa ihe o kwuru ụbọchị ole gara aga.

Image copyright Getty Images

Iji tuzie aka, ọ kọwara na ihe o kwuru bụ na ọ gaghị amanye ndị Naịjirịa onye ha ga-atụnyere na ntuliaka, kama na ndị Naịjirịa kwesịrị ịtụnyere ndị ga-arụ ọrụ hụ na ndụ ha dị mma karịa etu ọ dị ugbua.

Nhazi akwụkwọ iwu ntuliaka

Na nzukọ "Executive Session" a ga-enwe taa, a ga-ekpebi ihe a ga-eme maka ọjụjụ onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ibinye aka n'ihazigharị akwụkwọ iwu ntuliaka.

Image copyright Getty Images

Mara na ndị mmadụ gụnyere Mike Ozhekome, Atiku Abubakar na ndị isi a hụrụ kwaba okpu ndị ọzọ, katọrọ omume Buhari gbasara ya, na-ekwu na ọ dị ka ọ na-atụ ụjọ na ọ gaghị emeri na ntuliaka 2019.

Mmanụ ụgbọala ọ ga-akọ?

Ọ bụrụ na ị chị obi n'aka maka etu ị ga-esi eme mmanụ ụgbọala dịka a na-atụ ụjọ ma ndị na-ere ya a ga-agba abụbụọrụ, wetuo obi gị.

Nkenke aha onyonyo Igwe e ji ere mmanụ

Nke a bụ makana Ndu Ughammadu bụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ụlọọrụ NNPC, kwuru na ha nwere ebe mmanụ dọ, nke ga-ezu ndị mmadụ ihe ruru ụbọchị iri ise na abụọ.

Gụọ maka ya n'uju ebe a: 'Anyị nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru unu ' - NNPC

Na mba ofesi,

Image copyright EPA

Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron, na ndị isi otu chịkọtara ndị azụmahịa na ndị otu ndị ọrụ, ga-enwe nzukọ ebe ha ga-achọ inweta mkpebi maka ngagharịiwe a na-enwe na mba ya n'ime izu anọ.

Gere akụkọ BBC na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile