ASUP strike: "Gọọmentị emezubeghị nkwa ha kwere anyị"

Akụkọ dị mkpa

Otu jikọrọ ndị nkuzi na-arụ n'ụlọ akwụkwọ dị elu nke Politeknik bụ ASUP n'aha ịchafụ amalitela abụbụọrụ.

Image copyright Getty Images

Onyeisi ha bụ Usman Dutse, gwara BBC na ọ bụ makana gọọmentị etiti emezubeghị nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 nakwa 2017.

Minista agbaala arụkwaghịm

Minista Naịjirịa na-ahụ maka gburugburu bụ Ibrahim Jubril awụsala ọwa n'ọrụ ya, sị na ọ naghị arụzị.

Iwu ala machiri idina mmadụ n'ezi

N'agbanyeghị akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na ọ dịghị n'iwu, kọmishọna ndị uweojii na Legọs bụ Edgal Imohimi, ekwuola na iwu Naịjirịa machiri nwoke na nwaanyị idina onwe ha n'ọha, ma kwuo na o nwere ike ịkpọga gị nga afọ abụọ na ụma.

Na mba Brazil,

Otu nwoke a kpọrọ Euler Fernando Grandolpho agbagbuola mmadụ anọ tupu ọ gbagbuo onwe ya n'ime ụlọụka Metropolitan Cathedral dị n'obodo Campinas.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ụlọụka Metropolitan Cathedral ebe a Grandolpho gbagburu mmadụ anọ

N'egwuregwu,

N'agbanyeghị na a na-enyocha ụfọdụ ndị na-akwado otu Chelsea maka ịkpaso onye egwu Manchester City bụ Raheem Sterling oke agbụrụ, ọ ka na-enwuke ka ugo.

Image copyright Getty Images

Ndị otu Premier League nyere Sterling nturuugo "ọkachasị agba na Premier League nke ọnwa Nọvemba" nke mere ya ugboro abụọ ọ na-enweta nturuugo a.

Dike Igbo alaa mmụọ

Ndị mmadụ apụtala ị kwanyere onye bụbu onyeisi Ohaneze Ndigbo nakwa dọkịnta amaama bụ Dozie Ikedife ugwu ikpeazụ n'ọnwụ ya.

Dozie Ikedife dị afọ ira asatọ n'asatọ nwụrụ ụnyaahụ

Ọzọ,

Nkenke aha onyonyo Akwụkwọ udo ga-eme ka ndị na-azọ oche ọchịchị kwe nkwa na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi udo obodo na ntuliaka na-abịanụ

Ndị mmadụ na-ajụ ebe Oby Ezekwesili, Donald Duke nakwa Atiku Abubakar bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nọ ụnyaahụ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nkwekọrịta udo maka ntụliaka 2019.

Gụọ ya n'uju ebe a: Gịnị mere ahụghị Ezekwesili, Atiku n'ọgbakọ 'Peace accord'?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị otu MASSOB na-achọ ka gọọmentị etiti gere ha nti n'ọchichọ nwereonwe ha

Uchenna Madu bu onye ndụ otu MASSOB apụtala ịkwu na o nweghi onye nwere ikikere ịgbochi ndigbo ịlaghachị ala Igbo maka ntụlịaka n'afọ 2019.

Nke a na-abịa dịka otu akporo IDA n'aha ịchafụ nyere iwu na a ga-ada onye ọbụla nara ala Igbo, ọ kachasị ndị bi n'ugwu awụsa nha ma ha laghachị ala igbo na ntuliaka n'abịa.

Na mba ofesi,

Image copyright Reuters

Na mba ofesi ndị uweojii na mba Fransi na-achụ otu nwoke ji egbe wakpo ndị mmadụ n'ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg.

Ha kwukwara na mwakpo a tara isi mmadụ atọ ebe mmadụ iri n'abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile