Brexit: Ihe ụmụ Igbo bi n'ofesi chere maka Theresa May

Theresa May Image copyright Getty Images

Ọ bụ n'ụlọomeiwu nke mba Briten a kpọrọ ka e mere ntụlịaka nke ga-egosi ma ha akwadoro ihe Theresa May na-eme maka Brexit.

Ihe pụtara na ntụliaka ahụ bụ na ndị kwadoro Theresa May jiri vootu narị abụọ merie ndị akwadoghị ya nke mere na anapụghị ya ọrụ n'ike.

May na onwe ya kwuru na mgbasa ozi ya na ọ ga-aga n'ihu ịhụ na mpụta mba Briten n'ọgbakọ Yurop bụ ihe ga-abịa na mmezu.

BBC Igbo ajụọla ụfọdụ ndị Igbo bi n'ala ezenwaanyị Briten ihe bụ uche ha maka ya bụ okwu.

Chuks Ukoh bụ onye na-ahụ maka ihe gbasara nchekwa kwuru na ọnwụ May na-esi maka Brexit bụ iji mezu nkwa buliri ya n'ọkwa ọchịchị.

Image copyright Chuks Ukoh

O kwukwara na mgba a a na-agba maka Brexit ga-emetụta ọtụtụ ihe n'obodo ahụ dịka akanaụba obodo na obibi ndị mmadụ.

N'okwu ya "okwu a ga-akpalite nsogbu dị n'etiti mba a na Northern Ireland na mbụ."

Nwa afọ ọzọ bụ Kelechi Isiodu bụ onye na-arụ ọrụ Injinia n'ofesi

Image copyright Kelechi Isiodu

N'uche Kelechi, obi adịghị ya mma maka okwu Brexit a maka etu ihe ga-esi gbanwe.

Oji ịzụta ihe dịka ọgwụ were maatụ. Ọ sị na ụfọdụ ihe ga-etinye ego n'ihi na ọ bụghị zi ndị agbataobi ha na EU ka ọ dị n'aka.

Theresa May kwudosiri ike na ọ ga-mezu nkwa Brexit o kwere mana o kwukwara na ọ gaghị abụzi onye ndụ otu ya na ntụliaka ọzọ n'abịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara