Nigeria Election 2019: Onyeisiala Buhari na-arịọ ka enyekwuo ya obere oge

Akụkọ dị mkpa:

Ihe Buhari chọrọ ka ọ gbara afọ 76

Ebe foto si, @MBuhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla ndị Naịjirịa ka ha "do do do" nyekwuo ya nwantịntị oge iji mejuputa nkwa o kwere ndị mmadụ.

Buhari kwuru nke a mgbe ọ na-eme emume ncheta afọ iri asaa na isii (76) ya.

Richard Akindele agaala mkpọro afọ abụọ

Ebe foto si, ICPC

Ụlọikpe ukwu dị n'Ọshụn steeti atụọla onye bụbu onye ọkammụta na Mahadum Obafemi Awolowo bụ Richard Akindele, nga afọ abụọ.

Cheta na Richard Akindele rịọrịọ nwa akwụkwọ ya bụ Monica Osagie ka o nyetu ya ihe ya ka o were bulie ya n'ule akwụkwọ.

Mba Amerka awakpoola Al-Shabab na Somalịa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Al-Shabab na-akpa mkpamkpa na mba Sọmalịa

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu o, ndị agha ụgbọelu mba Amerịka sị na ha egbuola ndị omekataraihepụụjọ dị iri isii na abụọ (62), bụ ndị otu Al-Shabab na mwakpo ọhụrụ ha mere na Somalịa.

Mba Amerịka malitere ime mwakpo kpụ ọkụ n'ọnụ kemgbe onyeisiala Donald Trump bara n'ọchịchị.

Ewepụtala ka aga-esi gbaa Champions League

Ebe foto si, Getty Images

Ebiputala aha ndị ga-ezute ibe ka asọmpi Champions League na-abanye agba nke iri na isii (16).

Liverpool ga-ezute Bayern Munich, Man Utd ga-ezute PSG, Man City ga-ezute Schalke, Tottenham ga-ezute Borussia Dortmund, Real Madrid ga-ezute Ajax.

Barcelona ga-ezute Lyon, Juventus ga-ezute Atletico Madrid ebe Roma ga-ezute Porto.

Gee akụkọ BBC na nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Boko Haram awakpoola obodo ọzọ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Boko Haram wakporo otu ime obodo dị nsọ na Maịduguri, isi obodo Borno steeti ụnyaahụ.

Ndị omekaome a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma chụsasịa ndị bi na ya bụ obodo akpọrọ Maiborti.

Ndị agha Naịjirịa sị na ha zigara ndị agha ma ụgbọelụ ka ha chụpụ ndị oyi egwu n'obodo ahụ.

Nke a na-eme ka ozi pụtara na Boko Haram gburu ndị agha iri na abụọ ụbọchị Fraịde n'obodo Gudumali dịkwa na Borno steeti. Ndị gbara ama mwakpo Gudumali kwukwara na ọtụtụ ndị agha ka na-efu.

Nwodo sị ka gọọmenti nye ndi Igbo ohere ruru ha

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo adọla gọọmentị naịjirịa aka na ntị ka ọ kwụsị imegbu ndị Igbo

Nwodo kwuru nke a n'emume Igbo Day emere n'Akure, isi obodo Ondo steeti.

Na nkọwa ya, Nwodo sị na ndị kwesiri inwe ohere dịka ndị naijirịa ọzọ ebe ọbụla ha nwetere onwe ha na Naịjirịa.

N'ofesi,

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Otu ICRC kwuru na ha na-enyere ụlọọgwụ ndị nwere ọtụtụ ndị ọrịa aka site n'inye ha ngwọ ọrụ

Mba Saudi Arabia akatọla mba Amerịka maka mkpebi o mere ịta nwa eze Mohamed Bin Salman, maka ogbugbu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi.

Ndị Saudi sị na ozighiezi etu ndị omeiwu Amerịka jiri na-ebo Bin Salman ebubo a, ma kwukwa na anya na-acha ha ọbara ọbara maka mkpebi ha banyere agha Saudi Arabia na-ebuso mba Yemen.

N'asọmpị Premier league

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Alex Iwobi bụ nwa nwanne onye gbaburu Super Eagles bọọlụ bụ Austin Jay Jay Okocha

Nwa afọ Naịjirịa Alex Iwobi ekwuola na ọ bụ etinyeghị uche mere eji merie otu ya bụ Arsenal n'asọmpị ha na Southhampton gbara ụnyaahụ.

Iwobi sị na ndị Southampton gbara ọfụma, mana Arsenal achịkọtaghị obi ọnụ, nke mere ha ejighi rite mmeri na asọmpị ahu eji ọkpụ goolụ ato ha asatara abụo merịe ha.

Ihe nkiri taa:

Aha onyonyo,

Gịnị bụ 'Manage' n'asụsụ Igbọ?