Abụle Egba Fire: Ọkụ ọgbụgba erepịala ọtụtụ ụlọ,ọdọahịa na ụgbọala na Legos

Akụkọ dịmkpa

Ọkụ gbara n'Abule Egba dị na Legọs

Ebe foto si, Traffic Butter

Akụkọ ruru anyị ntị si na ọ bụ ndị na-agbapu igwe na-ebu mmanụ ụgbọala kpatara ọkụ a.

Ndị nọ ebe o mere kwuru na ọkụ ahụ sitere na mmanụ sị ụgbọala mmanụ wufuo.

Ebe foto si, Olanrewaju Ashimi

Nkọwa foto,

Ebe a na-ere ụgbọala ọku bara

Ọkụ a bidoro n'ọnụ ụtụtụ taa, abaala ụlọahịa na ụlọ obibi ndị mmadụ, mana amabeghị ma onwere onye nwụrụ na ya.

Ebe foto si, Olanrewaju Ashimi

Nkọwa foto,

Ọlụ ndị mmadụ gbara ọkụ

Nkọwa foto,

Igwe na-ebu mmanụ ndi omekome mepere, bu ihe butere ọkụ a

Ụlọikpe enyela ikike ka ejide nwunye Mugabe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Grace Mugabe bụ Nwunye Robert Mugabe nke Zimbabwe

N'ofesi, Ụlọikpe na Saụt Afrịka enyela ikike sị jide nwunye Robert Mugabe bụ Grace Mugabe bụ ndị chiburu Zimbabwe.

Grace Mugabe ji apịpịa "wire" pịatọ otu nwagbọghọ o jidere ya na ụmụnwoke ya abụọ n'ụlọ oriri na nkwarị na mba Saụt Afrika mgbe ha ka n'ọchịchị, mana iwu ekweghị sị kpee ya ikpe mgbe ahụ.

Ole Gunnar Solskjaer anọchiela Mourihno

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ole Gunnar Solskjaer

N'egwuruegwu, Manchester United akpọpụtala Ole Gunnar Solskjaer dịka onye ga na-achịkọta ndị otu egwu bọọlụ ahụ ruo na ngwucha agba asọmpị a.

Cheta na-achụrụ onye nkụzị ha bụ Jose Mouriho ụbọchị Tuzde ka Liverpool ji ọkpụ atọ asatara otu gwọọ ha ịba.

PDP gara nzụkọ ime ụlọ n'Aba

Ebe foto si, Twitter/Obi/Secondus/Atiku

Atiku Abubakar na Peter Obi bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na osote ya n'okpuru PDP, ekwela Ndigbo nkwa na ha ga-akwalite azụmahịa site n'iwulite nchekwa obodo, iwetu ego a na-akwụ n'ego mgbazinye na ihe ndị ọzọ ga-enyere ndị na-azụ ahịa aka.

Ha kwuru nke a n'Aba, Abịa steeti oge otu pati PDP na ndị ahịa nwere nzụkọ obodo ụbọchị Wenezde.

Muhammadu Buhari gụrụ akwụkwọ mkpata na mefụ akụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Muhammadu Buharí onyeisiala Naíjiría

N'ụlọomeiwu dị n'Abuja, onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara akwụkwọ mkpata na mmefụ akụ Naịjirịa maka afọ 2019 ebe ọ sị na ihe kacha mkpa n'afọ n'abịa bụ ibupute ndị mmadụ n'ụbịam site n'ime ka akụnaụba obodo a mụbanwanye.

Ndị pati nọ n'ụlọomeiwu ya nọrọ jaa ya ike, ebe ndị pati Ọzọ na akwa ya emo.

Ọnụọgụ ndị enweghị ọrụ na Naịjirịa agbagola

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọnụọgụ ndị enweghị ọrụ na Naịjirịa agbagola

Leekwe noo, Ọnụọgụgụ ndị enweghị ọrụ na Naijiria esila na pasent iri na asatọ 18.1 gbalite rue pasent iri abụọ na atọ 23.1.

Nke a bụ ozi ọhụrụ sị n'aka ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ nke a kpọrọ National Bureau of Statistis, NBS n'aha ịchafụ.

Gee nkeji mgbede

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị omekome egbuola onye bụbụ onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ ọchịagha Alex Badeh

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha elu Naịjirịa kwuru na Ọchịagha Badeh zutere ndị omekome n'ụzọ Abuja na Keffi ka o si ugbo ya ala.

Badeh dị afọ iri isii na otu mgbe ọnwu ike a zutere ya.

N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donlad Trump akatọọla Facebook, Twitter na Google makana ọ sị na ha na-akwado party na-anọghị n'ọchịchị n'Amerịka.

Nke a n'abịa ka otu ọkaikpe katọrọ Michael Flyn bụ onye sobu n'ọchịchịchị Trump maka mmekọ ya na mba ọzọ.

N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images

Onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ya agbanwela usoro otu egwuregwu ahụ ga-eji kwado asọmpị Iko mba Afrịrịka nke 2019.

Rohr sị na nhaziagharị a sotere nnapụ anapụrụ mba Kameroon ikike ihazi ya bụ asọmpị.

Nke a putaziri na Super Eagles agaghị anọ n'Uyo mee nkwado

Gee akụkọ ndị a be a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo,

"Ị dọọ m aka n'akwa ọ ga-esere anyị okwu"