Alex Badeh: Onye bụ ọchịagha ndị omekome gburu?

Alex Badeh Image copyright Getty Images

Ndị agha elu Naịjirịa kwuru na ọ bụ ndị omekome bu egbe gbagbụrụ onye bụbu onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Alex Badeh ụnyaahụ.

N'ihe ha dere n'akara Twitter ha, ndị agha ụgbọelu Naịjirịa sị na Badeh si ugbo ya ala be ya n'ụzọ si Keffi gawa Abuja mgbe ọdachi ahụ zutere ya.

Ndị agha Naịjirịa sị na ọ bụ ọnya Badeh nwetara ka a gbara ya egbe gburu ya.

Bukola Saraki, bụ onyeisi ụlọomewu ukwu nke Naịjirịa, na ogbo ya Yakubu Dogara nke ụlọomeiwu nta tinyere ọnụ na ya bụ okwu.

Ihe nwereike ịmasị gị ịma maka Badeh

Image copyright Efcc
Nkenke aha onyonyo EFCC kpupụrụ Alex Badeh ụlọ ịkpe maka mpụ na aghụghọ
  • Alex Badeh nwetara ọtụtụ ntụrụ ugo mgbe ọ bụ onye agha Naịjirịa.
  • Ọ nọ bu n'ọkwa onyeisi ndị agha Naịjirịa, nke a kpọrọ "Chief of Defence Staff" na Bekee.
  • Mgbe Boko Haram na-akpa ike n'Adamawa, ha wakporo obodo ya bụ ViMtim.
  • Boko Haram gburu nwanne ya nwoke ma gbaa ụlọ ya ọkụ na mwakpo ahụ.
  • N'ọnwa Febụwarị nke 2016, ngalaba na-ahu maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC nwụchikọrọ Badeh maka ebubo na aka ya di n'ohi ijeri naira atọ na puku itoolu.

EFCC si na Badeh ji ya bụ ego rụọ ụlọ nakwa ụlọahịa n'Abuja na ebe ndị ọzọ na Naịjirịa

Mana Badeh sịrị na aka ya dị ọcha.

A mụrụ Badeh n'afọ 1957.

O bidoro ọrụ dịka onye agha ụgbọelu n'afọ 1977.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a