'2019 Budget agaghị ezu Naịjirịa'

ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya Image copyright AFP

Wenesde 19 Dizemba, 2018 bụ ụbọchị Onyesiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari wepụtara akwụkwọ ọ chọrọ iji me iwu mpata na mefu nke Naịjirịa n'afọ 2019 nke Bekee kpọrọ "Budget".

Bọọjetị ọhụrụ a Buhari nyere ndị Omeiwu ka ha nyocha bu tarị naira asatọ na ọma.

Ya bụrụ na ndị Omeiwu kwenyere na ya, ọ ga bụrụ bọọjeị kachasị kemgbe Naịjirịa malitere.

Buhari na pati ya bụ All Progressives Congress (APC) sị na bọọjetị a bu nke ha chọrọ iji bụlịe Naịjirịa n'ọnọdụ ha kpọrọ "Next Level", bụ aha ha nyere ịchụ nta vootu 2019 ha.

Ka o sị dị ugbua, amabeghgị ma ndị Omeiwu a ga-ekwenye na ya, maọbụ weputeye ọsị ịsọ.

Owere ha ọnwa isi iji kwenyere na bọọjetị 2018, agbanyeghi na Buhari nyere ha ya n'ọnwa Novemba 2017.

Image copyright Presidency

Bọọjetị kachasị?

Agbanyeghị na bọọjetị a bụ nke kachasị n'ọnụọgụgụ na naira, o nwere ndị tụrụ aka na ya bụrụ na ọ bụ dọla ka e ji tule ya, bọọjetị a pere mpe karịa nke afọ 2014.

Bọọjetị 2014 putara ijeri $30, ka nke afọ a pụtara ijeri $24, dịka ụlọntaakụko Blomberg siri dee.

Nke a bụ makana ike ego Naịjirịa bụ naira bidoro dawa n'ike kemgbe afọ 2014. Narị naira 360 na ọma na ego otu dọla ugbua, mana o nwere mgbe o ruru narị naira 450.

Emu a kwara Buhari n'ụlọomeiwu akpatala okwu na-soshal midia

Ihe ndị mmadụ kwuru maka Bọọjetị 2019

Budgit, bu ngalaba abụghị nke gọọmentị na-etinye anya n'ihe mkpata na mmefu gbariri bọọjetị 2019 etu a:

Cheta Nwanze bu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere gọọmenti gwara BBC na bọọjetị nke 2019 adaala tupu ọ bụrụ iwu.

"Etinyere na ego a ga-eji mee ihe dịna bọọjetị a ga-apụta site na mmanụ agbịdi erere $59, taa, mmanụ agbịdị na-adazị $55.

Nke mere na o nweghi ebe bọọjeti ji azụ aga,"

Nwanze kwetekwara na ego dị na bọọjetị a perempe ma ya bụrụ na e ji dọla tule ya.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya bụrụ na ekee ego bọọjetị kwa mmadụ niile nọ Naịjirịa ọ ga epe mpe.

Nkenke aha onyonyo Ego eji akwụ ụgwọ ka nke eji arụ ọrụ na bọọjetị nke afọ a

Nwanze sị; "Ọ bụ ntụlịaka dị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'obi ugbua. Anyi aghaghị ahụ bọọjetị a anya ruo Eprel 2019."

Dọkịnta Ugo Egbujo bụkwa onye ọzọ ọnụ ya n'eru n'okwu kwenyere n'ihe Nwanze kwuru, ma kwuo sị na agụpụ ego eji akwụ ụgwọ, ego ndị ọzọ bu ihe ekwesiri ịgụ na dọla.

Ọ sị; bọọjetị abụghị nsogbu anyị, makana ọ bụ ihe Bekee kpọrọ estimate. Ihe bụ nsogbu bu ebe ego ahụ ekwesiri ịgbarị na ya bụ bọọjetị ga-esi pụta."

Ọ gara n'ihu kwuo na Naịjirịa kwesiri inyocha etu a ga-esi melata etu e ji amụ nwa, "makana ọ bụ oke ịmụta nwa mere ego ejighi ezu."

Ọ sị; "N'afọ 2017, Naijirịa si na ọ ga-akpata tarị naira iri na isii, mana ihe akpara bụ tarị naira abụọ. Akpaghị, ebite ebite, mana Naịjirịa adịghị ebitenwu etu o si chọọ."

Ọnyeisi ndị omeiwu bụ Bukola Sarakị mechara katọ ya bu bọọjeti, ma kwuo na ọbụghị ihe ga-abara Naịjirịa uru.

Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị