TGIF: Kedụ ihe ị ga-ejiri onwe gị mee n'abalị Fraịde?

Ndị gara ọgbakọ Image copyright Getty Images

Fraịde bụ ụbọchị ọtụtụ ndị mmadụ kachasị ele anya n'elekere ha.

Ngwụcha izu eruwela ya mere onye ọbụla ji n'eche ka ha gbasaa ọrụ were nwee ike ibido mewe ihe niile ha bu n'uche ịme kemgbe izu bidoro.

Ị rụọla ọrụ izu niile, o ruola oge ị ga-eji nedo onwe gị anya.

Onwere ike bụrụ na ihe iji ele elekere gị kwamgbe kwamgbe bụ ka imara oge agbantịlọ ji ebido.

Nwekwaa ike ọbụrụ na ọ bụ achọpụ ị ga akụ ma ịnaruo ụlọ bụ ihe dị gị n'uche.

Nke ọbụla ọ bụ, ya bụrụ na ọ bụghị ajọ ihe, anyị kwụ gị n'azụ.

Ka anyị lezie anya hụ ihe dị iche iche ndị mmadụ na-eme n'abali fraịde mara ma ịga ahụ onwe gị na nke ọbụla.

1) Ụfọdụ na-agba agbantịlọ

Image copyright Getty Images

Ịgba egwu bụ otu ụzọ eji ebelata mgbakasị ahụ dị anyị n'ahụ. Ma ị na-agbakwa ya bụ oringo, uche gị dikwa ya.

2) Ndị na-agụ akwụkwọ

Image copyright Getty Images

Onwere ndị bụ akwụkwọ ka ha ji agbanahụ ọgbaghara juru n'ụwa.

Ha kọọrọ gị akụkọ dị n'ime akwụkwọ ahụ, ị ga-eche na ha nọ mgbe o mere.

Ha gụba ya bụ akwụkwọ, onweghị ihe ị na-ekwu ha ga-anụ.

Nke a magburu onwe ya, ma gbaa mbọ hụ na ụbụrụ gị zuturụ ike.

3) Ụfọdụ na-ekiri ihe nkiri

Image copyright Getty Images

Ndị nke a dịkwa ka ndị akwụkwọ.

Ha chedo anya na televishọn, kwuo elu, kwuo ala, anya ha agaghị esi ebe ahụ pụọ.

Ọ dị mma iji ihe nkiri enweta onwe anyi, kama chetekwa na ọ dị mkpa ka anya gị zuo ike.

4) Ndị na-ehi ụra

Image copyright Getty Images

Ị nụtugo maka ndị n'akwụ ọtọ were na-ehi ụra?

Onwere ndị ura bụ etu ha si ezu ike uwa.

Ọ Bụrụ na nke a bụ gị, ọ dị mma, ụra dị mkpa maka ahụ ike uche anyị.

5) Ndị na-agba egwu n'ụlọ naanị ha

Image copyright Getty Images

Ndị a bụ ndị onwe ha n'atọ ka shuga.

Ha ga anọnwu naanị ha ruo mgbe ebighi ebi, ọ gaghị emetụ ha.

I so na ndi a?

Kpọnye egwu Maazi Phyno bụ Ọbiagụ, gbarịba egwu!

6) Ụfọdụ na-egori n'ụlọ enyi ha

Image copyright Getty Images

Ndị oyibo kpọrọ ya "sleepover".

Onwere ndị bụ izukọ n'ụlọ enyi ha, kparịta ụka, rie nri na hie ụra ka ha ji enweta onwe ha na Fraịde.

Ọ dị mkpa na ndị enyi zukọọ, akparịta ụka.

O nwee ihe na-enye otu onye nsogbu, o kwuputee ya ka ndị ọzọ nyere ya aka.

Ị hụ mmadụ, mmadụ ahụkwa gị.

7) Ụfọdụ ana-eneta ahụ ha anya

Image copyright Getty Images

Onwere ndị bụ na ngwucha izu ka ha ji apa onwe ha apa ka akwa.

Ha ga-ehicha ihu ha ka ọ bụ afere nkụwa, tee ude n'ahụ ha ka ọ bụ enyo, ma were mmiri ṅujuo afọ ka ahụ ha were na-emuke.

Jisie ike ma ọ bụrụ na ị so na ndị a.

8) Ndị na-arụ ọrụ n'abali Fraide

Image copyright Getty Images

Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ site na Fraide pụta na Satọde.

Ọ bụrụ na anyị arụghị ọrụ, anyi agaghị enwe ego aga-eji ledo onwe anyi anya.

Ya bụ na ọrụ dị mkpa.

Kama na ị na arụ, kawaa ahụ cheta izu ike ma mesapụ ahụ.

Akụkọ ndịọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a