Rochas: Uzodinma anataghị ikike iji ama egwuregwu mee achụmmnta vootu

Sinetọ Hope Uzodinma hiwere mmalite achụmnta vootu ya ụbọchị 21 ọnwa Disemba 2018
Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole ekwuola na pati ha agaghị abụkwa ebe a na-ele mmadụ anya n'ihu ị ma onye o metụtara tupu o nweta ọkwa.
O kwere nkwa na kama pati ha ga na-agbaso usoro onye kwue uche ya.
Oshiomhole kwuru nke a na mmalite achụmmnta vootu Sinetọ Hope Ụzọdịnma,onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha APC n'Owere ụbọchị Fraide.
Ọ gwara ndị otu pati ha na ya ji "ozi Olileanya bịa"
O gara n'ihu sị, "Ọ gaghị eme ọzọ na mmadụ ga-abanye n'ọchịchị maka na ọ bụ ọgọ nwoke maọbụ nwanne onye ma ọbụ onye ọzọ."
Ndị APC kara aka nọ na ọgbakọ ahụ
A na-atụ anya onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari, mana Oshiomhole, Andy Uba,Ayogu Eze, Uche Ogah so na Ndi APC nwere agba bịara n'ọgbakọ ahụ.
Mana ozi onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahu wetara anyị na-ekwu na ndị ụlọomeiwu APC na steeti ahụ dị mmadụ 27 awụchiela n' isi ụlọrụ APC na steeti ahụ.
A kpọchiri ebe Uzodinma chọrọ ime mmalite achụmmnta vootu n'Owere
E hiweburu mmemme ahụ n'ama egwuregwu Dan Anyiam mana akụkọ ruru anyị ntị kwuru igwe ndị mmadụ ndị gbakọrọ maka ya emeghị ịke ịbanye n'ihi na a gbachiri ebe ahụ agbachị .
Nke a mere na ha nọrọ n' isiụlọọrụ APC dị n'Okporoụzọ Okigwe mee ya bụ ọgbakọ.
A na-eche na ọ bụ ndị ọrụ gọọmenti Rochas Okorocha kpọchiri ama egwuregwu ahụ.
Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo n'ekwentị, o kwuru na Uzodinma etinyeghị akwụkwọ iji nata ikike iji ama egwuregwu ahụ mee ihe n'aka Kọmịshọna ọ dị n'aka.
N'aka nke ọzọ, otu onye ndị mgbasaozi achumta vootu Udodinma gwara BBC Igbo na ha kwụrụ puku narị naira asatọ na iri ise(N850,000) maka iji ama egwuregwu ahụ mee ihe ma natakwa ikike site na directọ na-ahụ maka egwuregwu na steeti ahụ.
N'ihi mkpọchị ahụ, Okporoụzọ Okigwe tachiri atachi n'ihi ọtụtụ ndị na-akwado APC pụtara n'igwe maka emume ahụ.