Zeal Akaraiwai na-agbapụta ndị enweghi ego ha ji akwụ ụgwọ n'ụlọọgwụ

Zeal Akaraiwai na dọkinta

N'obodo Naịjirịa, enweghị ọtụtụ ụlọọgwụ a na-anata ọgwụgwọ n'efu.

Kedụzi ihe ga-eme ma ọ bụrụ na i nweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ?

Maka ọtụtụ ndị ogbenye, ịhe ọ ga apụta bụ na a ga-edebe ha n'ụlọọgwụ, ikekwe ọkarịa otu ụbọchị maọbụ banye ọtụtụ ọnwa.

Onye ga enyere ha aka?

N'obodo a ndị mmadụ bu ụka n'isi, otụtụ ndị enweghị ike ịnyere onwe ha aka ewerela olileanya ha tinye na chukwu...

Zeal Akaraiwai enweghị nku nke mụọ ozi.

Image copyright Zeal Akaraiwai

O nwere ọmalịcha ụgbọọala Mercedes ojii, injin n'ada ụda, ya na oche dị egwu n'ime ya.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara ego dị afọ iri anọ n'ọma, nwoke mara mma, esila n'ime ụgbọala ya n'ụlọọgwụ gọọmentị na Legọs ripụta.

Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ ji obi aṅulị were kelee ya.

Ọ gara n'iru kpawa ụka o jiri bịa n'egbụghị oge.

Ọ jụrụ ha ese akwụkwọ eji edenye aha ndi nọ n'ụlọọgwụ ahụ.

N'ime akwụkwọ ahụ bụ aha ndi niile kwesịrị ila maka na-agwọọla ha, kama na onweghị ebe ha na-aga ebe ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ.

Image copyright Zeal Akaraiwai

Zeal ahụla ndị mmadụ ndị nọ na-ụlọọgwụ ruo izu isii maọbụ asatọ karịa ihe ha kwesịrị inọ maka na ha enweghị ego.

Ụfodụ ụlọọgwụ na agbasi mbọ ike ime ka ndị na-arịa ọrịa nwee ike ịkwụ ụgwọ ha obere obere ka ha were laa n'oge. Kama na-emegodi ya etua, ọ ka ga-esiri ndị ogbenye ike ikwụ.

Zeal gara n'ụlọọgwụ ụmụ nwoke nọ, ebe ahụ ka ọ hụrụ onye ọkpụ isi agbara egbe n'ụkwụ.

Ọ jụrụ ya bụ nwoke etu ọ ga-esi kwụ ụgwọ, nwoke zara na ọ na-ekpere chukwu. Zeal kwụrụ ụgwọ nwoke ahụ ji ka ọ were nwee ike ila.

Zeal anaghị akọtụrụ ndị ọ na-enyere aka, ọchọghịdị ka ha kelee ya ekele, kama otu ihe ọ chọrọ bụ n'otu ụbọchị, ha ga akọ akụkọ makaya, ha ga asị n'oge dị etua, ha nọ n'ụlọọgwụ, mụọ nsọ bịara kwụọ ụgwọ ha ji n'efu.

Zeal kwuru, "Ọbụ ihe kpatara m ji akpọ ya ọrụ mụọ nsọ, ka m bụrụ mụọ nsọ inwere olileanya ihụụ."

Ikwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị mmadụ bụ otu n'ime etu Zeal si aghọta okwukwe ya na chukwu.

Ọ chọrọ ka onye ọbụla soro ya na-enyere ibe ha aka. Ndị enyi na ezinaulọ Zeal na etinyekwa ego ha ikwado ya n'ezi ọrụ a ọ na-arụ.

N'ụlọọgwụ ụmụnnwanyị, akpọgara Zeal ileta agadi nwaanyị na-arịa ọrịa strok.

O kwuru na o nweghị ike ịkwụ ụgwọ nwaanyị ahụ ji n'ihi na ọrịa ya eteela aka ọ dịbara. Ọ bụ naanị ndị agwọtagoro fọzịrị sọ ụla ka ya ne-enyere aka.

"Ụfọdụ oge, anyị na-akwụkwa ụgwọ ndị ahụ na agbanyeghị," Zeal kwuru.

Zeal akwụọla ụgwọ ọtụtụ ndị na arịa ọrịa dị iche iche.

Ugbua, Zeal ahụla onye ọbụla nọ n'akwụkwọ ndepụta ndị ọrụ ụlọọgwụ nyere ya. Ọkwụọla ụgwọ ụlọọgwụ mmadụ asatọ.

O kwuru na gọọmentị kwesịrị ịgba mbọ hụ na ndị ọha nwere ihe Bekee kpọrọ "insurance" maka ahụike.

N'obodo Naịjirịa, ndị nwere ya nụ inshụransụ bụ sọsọ pasent ise.

Zeal kwuru: "Izu ọbụla, anam ahụ ihe na-eme ndị enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ. Ha na anwusịsị. Ego ole ka ndụ mmadụ bụ?"

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara