EFCC sị na ha ka ji mmadụ abụọ ha natara nde $2.8 n'Enugu

EFCC Image copyright EFCC
Nkenke aha onyonyo Otu onye omeiwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin, bụ onye degaara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ

Ọnu na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade, sị na ihe jikọrọ ha na ndị ha nwuchikọrọ n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam n'Enugwu, bụ ọrụ ha bụ ibuso mpụ na aghụghọ agha, ka ha na-arụ.

Orilade kwuru nke a mgbe BBC gbara ya ajụjụ maka akụkọ ha kesara ụbọchị 21 nke ọnwa Disemba, 2018, sị na ha jidere mmadụ abụọ bu nde dọla abụọ n'ụma aga Legọs.

Ọtụtụ ụlọntaakụkọ buru akụkọ a mgbe ọ pụtara.

Mana, okwu tụgharịrị ka akara Twitter ụlọakụ Union Bank tụpụụrụ akara EFCC ajụjụ.

Akara Union Bank, nke bụ akara e ji ama ma ọ bụ nke ezigbote ya, kọwara na njem ibu ego bụ nke iwu ji ụlọakụ Naịjirịa kwenyere na.

Image copyright Twitter

Akara Union Bank ahụ gakwara n'ihu dee na ọ tụrụ ha n'anya na EFCC wepụtara okwu tupu ha emecha nchọpụta.

Image copyright Chiagozie Nwonwu

Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu a.

Ụfọdụ na-ata EFCC ụta etu ha si gbara ọsọ gbaa okwu n'anwụ.

Mana o nwere ndị sị na okwu a edochaghị ha anya, makana enwere usoro e si ebu ego.

Orilade sị na ọ bụghị eziokwu na ha gbara ọsọ wepụta akụkọ a. Ọ sị na usoro ha bụ ime ka ọha mara ihe ha na-eme, ka ọ ghara ịbụ na ndị mmadụ kwuru ya, nke ga-eme ka ha zawa ọnụ ha.

"Ihe a mere ụbọchị Tọọsde (Disemba 20). Anyị chere ruo mgbede Fraịde tupu anyị ewepụta okwu. Nke a bụ makana anyị na-eche ka ndị ahụ ndị anyị nwụchiri kpọrọ aha, bịa. Onweghi onye anyị hụrụ ruo mgbe akụkọ pụtara."

Orilade gara n'ihu kwuo na ndị ha ji akọwaghị onwe ha ọfụma nke mere EFCC ji chọọ ime nyocha maka ego ahụ.

"Anyị agaghị ahapụ ha. Anyị ga-eme nyocha ọfụma tupu anyị amara nke bụ eziokwu."

BBC kpọrọ ekwentị ụlọọrụ Bankers Warehouse, bụ ebe ndị a aka ji sị na ha na-arụ ọrụ, mana ọ gaghị. Ruo mgbe edere akuko a, ha asabeghi ozi e tinyere n'akara email ha.

O nwere ozi ndị mmadụ na-eke na soshal midia a sị si ha n'aka, mana BBC agaghị ekwunwu ma ọ bụ eziokwu.

BBC degakwaara Union Bank ozi na email mana onwebeghị onye sara ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara