CAF Confederations Cup: Rangers Enugu akpaala ndị mmadụ obi aṅụrị

Akụkọ dị mkpa taa

N'egwuregwu,

Otu egwuregwu Rangers Image copyright Twitter/RangersIntFC

Rangers International meriri otu USM BEL ABBESS nke mba Ọljiria n'asọmpi egbe buru ọ laa na nke CAF Confederations Cup, n'Enugwu.

Goolu abụọ Bright Silas gbakpuru n'ọkara nke mbụ n'asọmpi ahụ nyere ha mmeri mere ka ha tozuo.

Rangers ga-ezute onye ọbụla e meriri n'asọmpi agba ngwụcha nke Champions League n'egbe buru ọ laa, iji nweta ohere isonye na "group stage".

Ebe Lobi stars meriri Gor Mahia nke Kenya iji ruo ihe Bekee kpọrọ "Group stage" n'asọmpi Iko Afrịka a kpọrọ CAF Champions League, nke mere ya mbụ ha na-eru ọnọdụ a kemgbe afọ 2000.

Ọkụ gbara ụlọọrụ achụmnta vootu APC n'Enugwu,

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ọkụ gbara ebe George Tagbo Ogara na-azọ ọchịchị gọvanọ Enugu steeti, ji mere ụlọọrụ achụmnta vootu ya na ụgbọala abụọ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC na ha na-esi imi n'ala inyoputa etu ọkụ a si bido.

Nzukọ Ecowas e mere n'Abuja,

Na nzukọ Ecowas e mere n'Abuja, Onyeisiala Muhammadu Buhari kpọkuru ndị isiala mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka ka ha jikọọ aka ọnụ mara nke e mere gbasara mpụ, ndị omekataraihepụụjọ nakwa ihe gbasara mgbanwe ihu igwe.

Na nzukọ a, ha ekwuteghikwa okwu ịkpọbata mba Moroko n'ogige Ecowas dịka mba ahụ siri chọọ.

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Japan a ma dịka Emperor Akihito ekwuola ihe ga-abụ okwu ikpeazụ ọ ga-ekwu ụbọchị ncheta ọmụmụ ya n'ọha tupu ọ rịtuo n'oche n'ọnwa Epreelụ 2019.

Emperor Akihito Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Nwa Akihito ga-anọchi ya n'afọ 2019

Akihito dị afọ iri asatọ na ise kwuru na ihe kacha emeda ya obi bụ na Japan agaghị agha ọzọ n'ime afọ iri atọ ọ chịchara, etu ha si gaa oge nna ya na-achị.

Osinbajo o kwuru na ndị yoruba nwe oche onyeisiala n'afọ 2023?

Osinbajo na Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Okwu agbụrụ ga-achi Naijirịa n'afọ 2023 ka na-aga n'etiti ndị ọchịchị na ụmụ Naịjirịa

Ọtụtụ ụmụ naịjiria akatọọla okwu na-ewu na soshal midia na Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibajo gwara ndị yoruba na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enye ha oche onyeisiala n'afọ 2023

maọbụrụ na ha tunyere ya na ntuliaka nke 2019.

Ihe na-ewu na intanet bụ na o kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta Eze ndị Oyo steeti bụ Alaafin, Oba Lamidi Adeyemi n'ụbọchị Disemba iri abụọ na abụọ nke afọ 2018.

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa kwuru na ha kwetere n'okwu ahụ ebe ụfọdụ na-ekwu na Osote onyeisiala enweghị ike ikwu udiri okwu ahụ.

Cheta na ndị dịka minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naijiria bụ Chris Ngige , Odee akwụkwọ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha ,Joe Igbokwe kwuburu na ndị Igbo ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023 maọbụrụ na ha tunyere onyeisiala Buhari na ntuliaka 2019.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a n'elu soshal midia

@honeyandsmart kwuru na udiri okwu a ekwesighị ị pụta n'ọnụ onyeisiala makana onye ọbụla nwereike ị bụ onyeisiala n'afọ 2023 ma o merie.

@Innocent_Nkire kwuru na otu Pati APC anaghị ekwu eziokwu gbasara agbụrụ ga-enweta oche onyeisiala n'afọ 2023.

Mana @VillageWizards kwuru na Osote onyeisiala bụ onye na-achọ udo agaghị ekwunwu udiri okwu a.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ

Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ na Naịjirịa akpọrọ NLC n'ichafụ ekwuola na ha ga-eme ngaghariiwe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwari ,2019,

iji gosi na obi adịghị ha mma maka etu gọọmenti etiti si adọti imezu mbulite ego opekatampe ndị ọrụ Naịjirịa ruo puku naira iri atọ.

Ha chọkwara ka ụlọọrụ na-enyocha mpu na nrụrụaka na Naịjirịa bụ EFCC nyocha ebubo na-ewere ego "Paris club reFund" nakwa ego ndị ọzọ enyere ikwado ndị steeti ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ wee mee ihe ọzọ.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Ụkpa ekele ka na-agara onye nchịkota ọhụrụ otu egwuregwu Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer,

dịka ụfọdụ na-ekwu na soshal midia na ọbịbia ya mere ka ndị otu egwuregwu Man united gbasie bọọlụ ike.

Egwuregwu nke mbu ndị Manchester United gbara n'okpuru Solskjaer mitara ha nnukwu mkpụrụ nke bụ na ha tiri otu Cardiff mmanwụ,

site n'inye ha ọkpụ goolu ise asatara otu n'egwuregwu Premiere League ha gbara n'ụbọchị Disemba 22, 2018.

N'ofesi, Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ n'alaọmajiji Indonesia ka na-arị

Image copyright BNPB
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru mmadụ iri isii na abụọ

Ihe ruru mmadụ otu nari, iri isii na asatọ anwụọla ebe mmadụ nari asaa, iri anọ na asatọ merụrụ ahụ n'alaọmajiji mere n'Obodo Sunda Strait dị na Indonesia dịka ozi ndị ụlọọrụ ọchịchị obodo ahụ si depụta.

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nlekọta ebe ihe mberede mere kwuru na ya bụ alaọmajiji mebiri ọtụtụ ebe obibi ndị mmadụ n'obodo ahụ.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ututu:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWorld Immigration Day: "O nweghị ebe yiri ụlọ"