Mininum Wage: Kee nkwụcha, anyị na-apụ ama - NLC

Ndị ọrụ na-eme ngagharị iwe Image copyright Peter Nnadozie/Facebook

Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị orụ na Naịjirịa akpọrọ NLC n'ichafụ ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwari 2019.

Ha kwuru na ọ bụ iji gosi iwe ha maka ndọtị gọọmenti etiti na-adọti mmezu mbulite ego ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ.

Akụkọ na-ekwukwa na ndị isi otu NLC kwuputere nke a n'ọgbakọ National Executive council meeting ha mere.

Dịka onyeisioche ha bụ Ayuba Wabba nakwa odeakwụkwọ ha bụ Peter Ozo-Eson si kwuo, ngagharịiwe a ga-eme na steeti niile dị na Naịjirịa.

Nke a na-emekwa dịka onyeisiala Buhari kwuru na ọ ga-ekpokọba otu ọzọ ilebanye anya ka a ga-esi mezuo ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ ndị ọrụ.

Mana ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia gbasara okwu a:

@dotenyinkeawas1 kwuru na mkpebi a bụ ihe ịkpa ọchị.

@afobelly na-ajụ kedụ onye ga-eso ha mee ya bụ ngagharịiwe?

Mana ‏@AinaAdeola6 kwuru na ndị ọrụ Naijirịa anaghị erite uru ha n'uju.

@Klinsdon kwuru na ọnwa Jenụwarị ka tere aka ime ya bụ ngagharịiwe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: