#ChristmasDay: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike'

Onye na-anya keke napep Image copyright Getty Images

Ị nọ n'ụlọ gị ugbua enweta ezumike? Mara na enwere ndị ọrụ ha ekweghị ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

Na ndị mmadụ na-ala ụlọ ekeresimesi maọbụ na ha nọ n'ụlọ maka ezumike a kpọrọ "public holiday" abụghị maka ọtụtụ n'ime ndị na-arụ ọrụ ndị a.

Ya mere, ka ị na-ekpori ndụ gị na-enwe aṅụrị, cheta na enwere ndị nọ ebe ha nọ na-eme ka ụbọchị na-aga were were na ndụ ndị mmadụ.

Otiegwu a ma ama bụ Olamide chetakwara ha.

Ebe o si "ka njọ" bụ na ọrụ ha enweghị nkwụsị, ọ bụ ọrụ a na-arụ ụbọchị asaa n'ime otu izu.

Ị nwere ike ịlelị ha anya, mana ị ma ụdịrị uru ha bara ọkachasị n'oge ezumike a?

BBC chọrọ ịkọwapụta ụfọdụ n'ime ha:

1) Ndị ọkwọụgbọala/ọgbatumtum:

Kedụ ụzọ ọzọ ị ga-esi gazuo ebe niile na-agụ gị ịga maọbụrụ na ị nweghị ụgbọala?

Image copyright Getty Images

Ọ bụ ndị ọkwọụgbọala maọbụ ọgbatumtum ga-ebuga gị ebe niile ị chọrọ ịga.

Ọ bụrụzịkwanụ na ha chịba ụkwụ n'ụlọ sị na ha nọkwa n'ezumike dịka ị si nọrọ, ị mara na ị ga-abụzị oji ụkwụ aga Aba.

2) Ndị ọrụ nchekwa:

Ndị uweojii, ndị agha na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ichekwa obodo kwara akpa ha lawa n'ụlọ kwuo na ha na-emechi ọrụ maka ezumike, kedụ onye ga-elekọta obodo?

Image copyright Getty Images

Ndị ọrụ nchekwa anaghị emechi makana oge niile, anya kwesịrị iru ha ala n'ihe na-aga ebe niile, ka ọgbaghara ghara ịdapụta.

Ọrụ ha gụnyekwara ịhụ na ị labara n'udo, ma hụ na anya gị abụọ mechiri ọfụma ka ị na-arahụ ụra.

3) Ndị ntaakụkọ:

Ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ ghara ịrụ ọrụ, kedụ etu ị ga-esi mara ma a sị "gbafuonu"?

Ọrụ ndị ntaakụkọ dị ezigbo mkpa makana etu ahụ ka ị ga-esi mara ihe na-eme n'akụkụ gị nakwa na mbaụwa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ntaakụkọ na-agba mbọ ịhụ na ka ị gbanyere ihe onyonyo maọbụ redio gị, na ị ga-ahụ ihe ị ga-ele maọbụ gere na ya

Ebe o si kara ndị na-arụ ya mma bụ na e nwere ike irụbiri ya arụbiri, nke bụ na ị rụtụ obere, onye ọzọ arụtụkwa obere, mana akụkọ ga-agarịrị n'ihu.

Ma ndị na-arụ na redio, ihe onyonyo, ndị na-ede ede, ndị na-agụ agụ, onye ọbụla na-apụta n'ọgbọ n'agbanyeghị ụbọchị ọ bụ.

4) Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ:

E kwesịrị ichetara gị uru ndị dọkịta na nọọsụ bara na ndụ mmadụ?

Ọrụ ha anaghị ama mgbe bụ ụtụtụ, abalị, maọbụ ụbọchị ezumike, n'ihi na ha ga-anọ ya ma mmadụ anọ n'ogige ha maọbụ anọghị, makana anaghị amacha mgbe ihe ga-ebute mmadụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kedụ ebe ị ga-aga ma enwee ka ahụ si eme gị ka ị na-ekpori ndụ?

5) Ndị na-arụ n'ọdọụgbọelu:

A ga-asị ndị mmadụ emela njem ụgbọelu n'ihi na "ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ezumike"?

Ị mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-emerịrị njem, mana kedụ onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ị mere njem ụbọchị kwesịrị ịbụ nke ezumike?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọdọụgbọelu na-arụgide ọrụ ma n'ụtụtụ ma n'abalị

Ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu; dịka ndị ọkwọụgbọelu, ndị na-elekọta ndị mmadụ n'ime ya nke Bekee kpọrọ "air host/hostess", ndị injinia ọrụ ha bụ ilekọta ụgbọelu tupu o felie nakwa ndị ọzọ ọrụ ha bụ

ịhụ na njem gị n'ụgbọelu ga-aga ọfụma.

6) Ndị na-ere nri:

Eeh! N'ezie ọ na-akara ọtụtụ ndị mma isi nri ha ga-eri n'ụlọ ha, mana kedụ maka ndị na-enweghị ohere ahụ?

Kedụkwanụ maka ndị na-apụ ọrirị ebe a na-ere nri dịka ụlọ oriri na nkwari na nke Bekee kpọrọ "fast food joint"?

Image copyright Getty Images

"Nri bụ ndụ", ndị na-ere nri ma nke a, ya mere ha ji azọ ndị mmadụ ndụ site n'ire nri ma n'ụbọchị ezumike o, ma n'ụbọchị nkịtị.

7) Ndị ọrụ gbatagbata:

Ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ ọgbụgba, ndị ọrụ ha bụ ịzọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede nakwa ndị ọzọ na-arụ ụdịrị ọrụ ndị a, anaghị achịba ụkwụ n'ụlọ.

Image copyright Getty Images

Ha na-aga ọrụ makana ụdịrị ọdachi a nwere ike ịdapụta.

8) Ndị nchekwa ụlọmkpọrọ:

Ha laa ezumike, onye ga-echekwa ndị nọ n'ụlọmkpọrọ?

Image copyright Getty Images

Ọrụ ha bụ ịhụ na ndị a tụrụ nga agbafughi ga kpaa mkpamkpa, ya mere ha ga-anọ ya site n'ụtụtụ ruo n'abalị, ịhụ na ihe ndapụta adapụtaghị.

Ka mmadụ ghara ikwu "aka m adịghị n'ihe mere".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara