Ndị uweojii enwetala ụgbọala ụkọchukwu Katọlik abụọ a tọrọ n'Anambra steeti

Akụkọ ndị dị mkpa:

Ntọ atọrọla ụkọchukwu Katọlik abụọ

Image copyright Getty Images

Ndị uweojii na Anambra steeti ekwuola na ndị ntọ atọrọ ụkọchukwu Katọlik abụọ na-arụ n'ụlọụka St Theresa dị n'Umueze Anam, Anambara steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na ihe a mere n' Umuleri ma kwukwa ha enwetala ụgbọala ụkọchukwu ahụ ndị ji egbe tọrọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha na-enyocha ya bụ mwakpo ka ha wee zọpụta ndị Fada a tọọrọ.

Dino/Idris Image copyright Getty Images/AFP
Nkenke aha onyonyo Nke a abụghị nke mbụ Melaye na-ebo ndị uweojii maka udiri nwakpo a

Sinatọ Dino Melaye na-anọchite anya ndị mpaghara ọdịda anyanwụ steeti Kogi edepụtala n'akara twitter ya na ụjọ ji ya aka makana ebubo ọ na-ebo onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris

na ọ chọrọ ịnwuchi ya ma were ntutu ọgwụ gbagbuo ya.

Mana Idris apụtala katọọ okwu ahụ, na-ekwu na ọ bụ arụrụala, ihe ọchị nakwa mbọ Melaye na-agba ịji dughie ụmụ Naịjirịa.

Na ndọrọndọrọ ọchchị,

Gọọmentị Akwa Ibom ekwetela ịnye ọgbọ egwuregwu 'Godswill Akpabio International Stadium' maka mmalite achụmta vootu nghọpụtagharị onyeisiala Buhari na ntuliaka 2019 na mpaghara ọdịda anyanwụ

Naịjirịa.

Cheta na ndị ọchịchị steeti ahụ jụbụrụ inye pati APC ọgbọ egwuregwu a maka nkwado asọmpi Naịjirịa Premier league football nke ga-ebido n'ọnwa Jenuwarị iri na atọ, 2019.

N'Egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agbapụbeghị otu Liverpool n'Asompi Premier League nke izu a

Onye nchikọta otu egwuregwu Liverpool bụ Jurgen Klopp agwaala ndị nso nso ha ụjọ atụla ha n'ihi na ha ga-emeri otu Newcastle ma ha zute ha na asọmpi Premier League nke mgbede December iri abuọ na

isii nke afọ 2018.

O kwuru na otu Liverpool ga-agbagotekwu na tabulu pointi ha kama ị gbatụ agbatụ.

N'ofesi,

Image copyright ARGENTINE POLICE
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị a na-ewepụtabeghị aha ebe ndị uweojii na-eduga ya n'ụgbọala a ga-eji bupu ya ebe ahụrụ ya na nwa ya

Otu nwaanyị si mba Argentina enwerela onwe ya kamgbe afọ 1980 ndị na-atụ mgbere mmadụ tọrọ ya.

Ọ bụ ndị uweojii si Bolivia na Argentina hụtara ụlọ ebe eji nwaanyị ahụ na nwa ya nwoke dị afọ itoolu.

A maghị ebe nwaanyị a onye rugoro afọ iri anọ na ise nọ kamgbe afọ 1980 ruo mgbe ndị uweojii chọtara ya.

Nkeji Ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristmas Travel: Ihe mere anyị ji etinye ego n'oge Ekeresimesi -Ekeson