Ọ bụghi eziokwu na anyị adịghị aza oku ndị Umunze - Uweojii

Uweojii Nigeria Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti

Ndị Uweojii n'Anambara steeti etinyela ọnụ n'akụkọ na ha adịghị eme ihe ha kwesịrị ime banyere ntọ mmadụ.

Haruna Mohammed bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara, gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ha adịghị aza oku ma a tọrọ mmadụ makana ọ bụ ọrụ ha ịhụ na obodo nwere nchekwa.

Mohammed kwuru okwu a ka ụfọdụ ụlọntaakụkọ dere na ndị mmadụ n'Umunze sị na ntọrị na-eme na be ha adịghị enweta enyemaka dịka o si kwesị n'aka ndị uweojii.

Okwu a metụtara otu onye nkuzi na-akuzi na mahadum Federal College of Education aha ya bụ Okwuchi Njoku.

Ndị ntọrị a nwụchiri Njoku n'ahịa nkwọ Umunze.

E mechara tọghapụ Njoku, mana a na-eche na ndị be ya nyere ndị ji ya ego mgbapụta.

Ihe a mere ka ụfọdụ ndị mmadụ ji na-ekwu na ndị uweojii emeghị ihe ha kwesịrị maka ntọrị na-eme.

Ụlọntaakụkọ Sun dere na otu onye ma maka ihe mere, aha ya bụ Chijioke Nwankwo, gwara ha na Njoku nọ na-akpọ ndị mmadụ mgbe ahụ ọ nọ n'aka ndị ntọrị na-arịọ ego.

"Ekwentị ya na-arụ ọrụ, nke ndị ji ya na-arụkwa ọrụ, mana ndị uweojii emeghi ihe ha kwesịrị ime," Nwankwo gwara ụlọntaakụkọ Sun.

Haruna sị na akụkọ a abụghị eziokwu makana ya bụrụ na a gwara ha, ha ga-agba mbọ hụ na azọpụtara nwaanyị ahụ.

"Ya bụrụ na o nwere ihe mere nke agwaghị ndị uweojii, onweghị etu anyị ga-esi mee ihe ọbụla maka ya."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na onweghị ihe dị ka oke ntọrị mmadu na-eme n'Umunze, n'agbanyeghị nke Njoku.

"Anyị na-eme nchọpụta maka ihe a mere ugbua," Haruna kwuru.

Image copyright MOhammed Haruna
Nkenke aha onyonyo Ndi aka ji maka ohi

Ọ sị na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ nwee usoro ha ga-eji na-ezitere ndị uweojii ozi ma ụdịrị ihe a mee.

Haruna gwara BBC na ọrụ nchekwa ndị Uweojii na-aga n'ihu ọfụma. O kwuru na ha nwụchikọrọ ndị ohi nọ na-ezu ohi na Nkpọọ.

Ndị a aka kparala bụ Sunday Eze dị afọ 22 na Gabriel Ogadi dị afọ 20.

Aṅụ nkụ na egbe a natara ndị dị n'aka ndị uweojii.

Ndị a ga-enwete oge ha n'ihu ọkaiwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: