Christmas: Ihe mere ụmụnwaanyị jị anọte aka n'usekwu n'oge Ekeresimesi

Usekwu

Ebe foto si, Getty Images

Ọ ka ana-agbagọju ọtụtụ mmadụ anya n'ala Igbo etu ụmụanwannyị sị anọteka n'Usekwu oe Ekeresimesi ọ bụla.

Mgbe anyị jụrụ ụfọdụ ụmụnwaanyị ihe mere ha ji achọrọrịrị isi nri ụbọchị ahụ karịa ma ịnye ya onye ọzọ ka o siere ha maọbụ sie nri ahụ ụbọchị ọzọ tupu ụbọchị Ekeresimesi.

Lee ihe ha sara anyị.

Ọrịaku Sarah Medebem kwuru na ọ nọ n'Ụsekwu site n'elekere iri na otu ruo elekere ise nke mgbede.

O kwuru na o siputere osikapa, ofe na Salad nye ndị be ya ma nyekwa ndị ọbịa.

Usekwu

Ebe foto si, Getty Images

Oriakụ Stella Ezenwa kwuru na o ji elekere anọ na ọkara wee sie ofe ọha, sụọ akpu, ofe akwụ na osikapa.

Oriakụ Nkem Ezike kwuru na o ji ụtụtụ bido siwe nri tupu ọ mara ihe na-emenu ọkụọla elekere isii nke mgbede.

Usekwu

Ebe foto si, Getty Images

Ọriakụ Sandra Harison kwuru na n'agbanyeghị na di ya agaala ala Igbo maka emume Ekeresimesi, o siri ọtụtụ nri.

O kenyere ndị agbataobi ya nri o ji osiri elekere atọ wee si.

Usekwu

Ebe foto si, Getty Images

Mana Ugonna Okafor kwuru na dọkita ya gwara ya na ya abakwala usekwu n'oge mmemme a.

O kwuru na ọ bụ makana ọ ka na-agbake n'ọrịa.

Usekwu

Ebe foto si, Getty Images

Oriakụ Onyinye Ifionu kwuru na o ji elekere anọ wee si nri niile o siri ụbọchị Ekeresimesi.

O kwuru na ihe mere ụmụnwaanyị jị anọteka n'usekwu bụ makana ụbọchị ekeresimesi pụrụ iche .

O kwuru na onweghị ike inye onye ọzọ nri ka o siere ụbọchị ahụ makana ọ bụ ụbọchị ụmụnwaanyị kwesiri iji leta Ezinaụlọ ha ọfụma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: