Boxing Day: Ọ bụ ụbọchị e ji akụ ọkpọ?

Ndị na-akwọrị ndụ na mmiri dị na Legọs

Mbido 'Boxing Day' edoghị anya, mana a na-ekwu na 'omenala' bidoro n'ụka oge gboo, oge ndị ụka ji igbe anatakọta ego e ji enyere ndị mmadụ aka.

Ngwugwu ndị mmadụ na-atụkọ a na-atọpe ya ụbọchị Disemba 26, ụbọchị ncheta onye nso Stephen bụ onye mbụ e gburu maka ikwenye na Kraist.

Mana amara ndị mba Briten dịka ndị bidoro were ụbọchị Disemba 26 dịka ụbọchị ezumike.

Ha na-enye ndị na-agbara ha odibo maọbụ ndị na-arụụ ha ọrụ ezumike ma nyekwa ha ihe onyinye.

Omenala mechara gbasaa na mba ndị ọzọ dịka Canada nakwa Australia.

Na Naijiria, ụfọdụ na-eche na emume a metụtara ịkụ ọkpọ.

Aha onyonyo,

Christmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi

Kedụ ụbọchị bụ Boxing Day?

Boxing Day bụ ụbọchị na-esote ụbọchị ekeresimere bụ abalị December 26 ọbụla.

Ụbọchị ahụ na-abụkarị ụbọchị ezumike na Naịjirịa nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na December 26 dabaa n'ụbọchị dabaa ụbọchị satọde maọbụ Sọnde, a ga-eme Tuesde na-abịanụ ụbọchị ezumike ma mekwa ụbọchị Mọnde ezumike.

Aha onyonyo,

Christmas Travel: Ihe mere anyị ji etinye ego n'oge Ekeresimesi -Ekeson

Ihe ndị a na-emekarị ụbọchị ahụ

Ụmụ Naịjirịa na-ejikarị ụbọchị ahụ ezuike dịka ha ji ụbọchị ekeresimesi sie ọtụtụ nri.

Ha jikwa ya erikwa ọtụtụ nri ndị ọzọ dịka ndị ezinụlọ ha nakwa agbataobi ha butere ha iji kelee ha maka mmeme ekeresimesi.

Ụfọdụ na-ejikwa ya eme mkpagharị nlegharị anya maọbụ kirie mmọnwụ n'ala Igbo.

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ ndị ga-amasị gị: