2019 Elections: Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ka anyị resi ha PVC

Ebe foto si, INEC NIGERIA/FACEBOOK
PVC ndị anatabeghị
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec etiela mkpu gbasara PVC ndị mmadụ anatabeghi na ihe ndị ndọrọndọro chọrọ ka ha mee.
Kọmishọna Inec n'Oyo steeti akpọrọ Mutiu Agboke gwara ndị ntaakụkọ na ndị ndọrọndọrọ na-akwanye ha ọkụ n'ike maka ịzụta PVC ruru 914,529 nke ka dị ha bụ Inec n'aka.
"Inec kwudosiri ike n'ịhụ na ntuliaka 2019 ga-aga n'ụzọ kwụ ọtọ" bụ ihe o kwuru.
O ji kwa ohere ahụ rịọ ndị ntaakụkọ ha soro tinye anya n'ihe gbasara ntuliaka n'abịa n'afọ 2019.
Inec ebidola okike akwụkwọ ntụliaka akpọrọ PVC mana ụfọdụ ndị mmadụ anatabeghi nke ha dịka ntuliaka 2019 n'abịa nso.
Iwe ji ndị anatabeghị PVC n'Enugwu
Akụkọ ndị ga-amasị gị