Concert: Etu ị ga-esi gbanahụ mwakpo na mmemme egwu

Ndị gara mmemme Image copyright Getty Images

Etu ị ga-esi chekwaba onwe gị na mmemme egwu a kpọrọ "music concert" na Bekee.

Oge mmemme ekeresimesi bụ oge ndị mmmadụ ji apụ apụ ekworị ndụ.

Ebe ọ na-akpọtụ akpọtụ ka ụmụntorobịa na-aga oge ekeresimesi a na emume ndị ọzọ.

Otu n'ime ebe a bụ nzukọ ebe ndị n'eti egwu na-abịa agụ egwu ha nke ndị Bekee kpọrọ, "music concert".

Anyị anụla ọtụtụ akụkọ gbasara ka esi awakpo ụmụnwaanyị n'ebe dị etu a.

E nwere ike iwakpọ gị bụ nwaanyị n'ụdịrị mmemme a dị ka e si mee nwaanyị a.

Ọ gara mmemme Davido mere na nsonso a wee kwuo na a nara ya ekwentị ya ma wakpokwa ya.

Lee ụfọdụ azụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa tụnyere anyị bụ ka ụmụnwaanyị na-aga ikpori ndụ ga esi were chekwaba onwe ha.

Uzoma Anyaora kwuru sị:

  • Ụmụnwaanyi na-aga ụdị ebe a kwesịrị ijide ihe ndị Bekee kpọrọ "taser" ya na "pepper spray" ọ ga-abụ onye bịa inye ha nsogbu, ha ewere ihe ndị a were chekwaba onwe ha.
Image copyright Getty Images

Onye ị gbara "pepper spray" ga-eburugodu ụzọ chọwa etu ọ ga-esi hụ ụzọ tupu ọ kọwa etu ọ ga-esi metụ onye ọzọ aka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo ị ga-ejinwu ose na mmiri a gwọkọrọ ọnụ rụọ ihe Bekee kpọrọ "pepper spray" nke ị ga-ejinwu gbaa onye ọbụla wakporo gị n'ihu

Nma Olebara kwuru sị:

  • Ụmụnwaanyị kwesịrị ịnọkọ ọnụ, na-aga n'igwe n'ihi na ọ na-ahịa ahụ ịwakpo ọtụtụ ụmụnwaanyị nọkọrọ ọnụ.
Image copyright Getty Images
  • Ọ bụrụ na gị bụ nwaanyị hụ na ị nọ na nsogbu maọbụ na o nwere onwe chọrọ ịwakpo gi, tiwe mkpu, kpọba oku ka ndị mmadụ mara ihe n'eme.
Image copyright Getty Images

Haruna Mohamed kwuru sị:

  • Onye ọbụla ejina ihe bara uru maọbụ dị ọnụ were gawa ụdịrị ebe ahụ dịka ọlaedo na ọlaọcha maọbụ ekwentị.
Image copyright Getty Images
  • Gbaa mbọ hụ na ị nwere akara ekwentị ndị uweojii nọ na okirikiri ebe a na-eme mmemme ahụ ka ọ ya abụ ọ kpọtụba, ị kpọrọ ha ka ha nwee ike ịgbata ọsọ enyemaka.
Image copyright Getty Images

Ndị okachamara n'ihe gbasara nchekwa kwukwara na ọ dị mkpa na ụmụnwaanyị yichiri onwe ha ọfụma ma ha na-aga mmemme ahụ ma hapụkwa ịṅụ oke mmanya ka ha were mara oge ịhe ọbụla bidoro.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara