Shehu Shagari: Ihe ndị o mepụtaara ụmụ Naịjirịa

Shagari/Nri Image copyright Getty Images

Ndị mmadụ ka na-eti ezinaụlọ onye chibụru Naịjirịa site n'afọ 1979 ruo 1983 bụ Shehu Shagari, aka n'obi kemgbe ọ nwụchara n'abalị ụbọchị December iri abụọ na asatọ nke 2018.

Ndị dịka onyeisiala Buhari kasiri ndị be ya ọ hapụrụ obi ma rịọ ka Chukwu nọnyere ha n'oge a.

Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa kwukwara maka ọrụ ọma Shagari rụru dịka onyeisiala.

Mana onwere ihe ndị Naịjirịa agaghị echefu maka nwoke a chịrị ha dịka onyeisiala n'afọ 1983?

Nke mbụ ha agaghị echefu bụ ihe a kpọrọ "Green revolution", nke mere ka agụụ ghara ịnyụ ụmụ Naịjirịa ịkpakwụ.

Image copyright Getty Images

Ọ rụpụtaara ụmụ Naịjirịa ọtụtụ ebe obibi dịka nke a kpọrọ "Shagari Estate" dị na Legọs, ma mekwa ka ego ya ghara ịdị ọnụ.

Image copyright Getty Images

O tinyere ego na Delta steel, Ajaokuta steel nakwa Steel Rolling Mill.

A na-eji steel arụpụta ọtụtụ ihe e ji arụpụta ụlọ, akwa, na ihe e ji edozi obodo.

Image copyright Getty Images

Ndị Igbo agaghị echefu etu o si họrọ Odogwu Alex Ekwueme dịka osote ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Dr Alex Ekwueme bụ ọnye ndọrọndọrọ ọchịchị a mara dịka onye nwere ọtụtụ nzere agụmakwụkwọ mahadum

Makana ha na-eche na ihe o mere nyere ndị Igbo ọnụ okwu ọzọ na Naịjirịa kemgbe alụchara agha Biafra n'afọ I970.

Ndị ọzọ dịka Ben Murray Bruce bụ sinetọ, tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ.

Ọ chịrị dịka minista ugboro asaa maka ezigbo agwa a hụrụ n'ime ya.

Shagari bụ minista na-ahụ maka nkwalite akụnaụba obodo n'afọ 1970, minista na-edowe ego ndị n'ala ezumike nka n'afọ 1962, minista na-enyocha mpụ ndị uweojii na-eme nakwa minista na-ahụ maka idozi Naijiria n'afọ 1967.

Ọ rụkwara dịka kọmishọna na-ahụ maka ngalaba dị iche iche n'ọdịda-anyanwụ steeti dị n'Ugwu Awụsa.

Ọ bụ ya bidoro ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa n'afọ 1979 mgbe o meriri na ntuliaka dịka onyeisiala.

N'afọ 1979, Shagari zọtara oche onyeisala mana n'afọ 1983, Muhammadu Buhari bụ onyeisi ndị agha Naijirịa mgbe ahụ, napụrụ ya ọchịchị n'ike.

Akụkọ kwuru na kamgbe afọ 1986 ka a kwụsịrị Shagari ime ihe ọbụla gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ka Shehu Shagari si nwụ

  • Ọnwụrụ n'elekere isii na ọkara na National Hospital Abuja ụbọchị Disemba iri abụọ na asatọ,2018
  • E bugara ya ụlọọgwụ n'ụbọchị Ekeresimesi mgbe ọrịa ya bidoro ịka njọ.
  • Ọ rịara ọrịa oyi ịba n'ahụ nke ọjọọ ya akpọrọ "pneumonia"
  • Ọ nwụrụ n'afọ iri itoolu na atọ
  • Tupu ọ nwụọ, ọ bụ Tukarin nke Sakkwato
  • Ọ mụtara ụmụ iri itoolu ma lụkwa ụmụnwaanyị abụọ
  • E liri ya ụbọchị 29 nke Disemba 2018, na Sokoto

Akụkọ ndị ga-amasị gị: