Shehu Shagari: Buhari agaala mgbaru na Sokoto
Akụkọ dị mkpa:
Mgbaru Shagari
Onyeisiala Muhammadu Buhari agaala mgbaru n'ezinaụlọ onye chịburu Naịjirịa bụ Shehu Shagari, na Sokoto.
Cheta na e liri ya ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa a, n'usoro ndị alakụba.
Ebe foto si, @MBuhari
Ọzọ,
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Anambra na-ekwu na ha achọpụtala ihe butere ọkụ a, ebe ndị uweojii na-ekwu na ha mabeghị ihe kpatara ya.
Gọọmentị Anambara gwara BBC na ha amalitela usoro ịhọpụta 'nke bụ nke' n'ime ihe ruru ozu iri ise gbara ọkụ n'otu ụlọozu dị n'Enugwu Ukwu.
Gụọ ya n'uju ebe a: 'Ozu gbara ọkụ ruru 50' - Kọmishọna ahụike Anambara
N'ofesi,
Kamal Hossain bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọso onyeisiala Mba Bangladesh bụ Sheikh Hasina oche ya na ntuliaka ha na-eme na mba ha, akatọọla ntuliaka ahụ ma kwuo sị ka e megharịa ya.
Ebe foto si, Reuters
N'agbanyeghị na ọ dị ka Hasina na-emeri site na vootu ole a gụkọrọla, akụkọ na-ekwu na aka enwe dị n'ofe, ebe ọgụ dapụtara na ntuliaka ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa.
N'egwuregwu,
Otu ọkpụ goolu Ngolo Kante nyerela Chelsea, mere ka ha merie Crystal Palace, ma mee ka ha were pọịntị ise na-aga Arsenal na Premier League.
Ebe Man City gbarala isi onwe ha site n'iji ọkpụ goolu atọ merie Southampton na be ha.
Ndị Igbo kwesịrịịchị n'afọ 2023 - Obasanjo
Onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa akpọrọ Olusegun Obasanjo arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha nye ndị Igbo ohere ịchi Naịjirịa.
Ebe foto si, Getty Images
O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'Ukpor dị n'Anambara steeti.
O gwakwara ndị Igbo ha kpachara anya ha maka nkwa APC na-ekwe ha maka inweta oche onyeisiala na n'afọ 2023 makana ọ bụ ihe efu i were okwu ndị otu pati ahụ wee mere ihe.
Lee ihe ndị mmadụ sara ya na Twitter
@lanrehussain kwuru ka Obasanjo chere ka emecha ntuliaka 2019 tupu okwuwe maka ntuliaka nke 2023.
@justopomulero na-ajụ maọbụ Atiku ka a ga-atụkwasị obi inye ndị Igbo ọchịchị n'afọ 2023.
Mana @AbdulRa60024938 etu o si nye onye Igbo ọchịchị n'afọ 2007.
N'akụkọ ọzọ,
Ebe foto si, EPA
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ọkọlọtọ Naịjirịa yọdatatụ na ebe niile ehibere ụlọọrụ ndị agha Naịjirịa iji wee kwanyere Shehu Shagara onye bụbụ onyeisiala Naịjirịa, nwụrụlanụ ugwu ikpeazụ.
Eliri Shagari onye nwụrụ ụbọchị Disemba iri abụọ na asatọ n'Abuja na be ya n'ụbọchị Disemba iri abụọ na itoolu.
N'ofesi
Ebe foto si, AFP
Ebidola itu vootu na mba DR Congo kamgbe adọtịchara ntuliaka ruo afọ abụọ.
Ihe ruru mmadụ nde iri anọ ruru itu vootu na mba ahụ ebe onyeisiala bụ Joseph Kabila nọ n'oche ọchịchị kamgbe afọ 2001 kwetere iritu.
Mana nkwado ya bụ ntuliaka nwere ọtụtụ nwakpo na nsogbu makana achọrọ ịnapụ mmadụ ruru otu nde na ọma ikike ịtụ vootu.
N'Egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe Liverpool merichara Arsenal n'asọmpị Premier League ha gbara n'ụbọchi Disemba iri abụọ na itoolu, ndị mmadụ kpụ ọgbabọọlụ Pierre -Emerick Aubameyang n'ọnụ.
Ụfọdụ kwuru na etu o si gbaa boolu edoghị ụwa anya dịka onye ama na-akpa ike n'egwuregwu bọọlụ.
Ha kwukwara na ohere ịsa goolu o mefuru karịrị akarị.
Nkeji Ututu
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri taa
'Onye anọghị ebe e so kee ihe, oke ya efuo' - Victor Umeh