Anambra Mortuary Fire: 'Anyị ahọpụtawala ozu iche iche" - Gọọmentị Anambara

Dr Joe Akabuike, Image copyright Gọmenti Anambra steeti
Nkenke aha onyonyo Kọmishọna na-ahụ maka ahụike Dr Joe Akabuike,

Gọọmentị Anambara gwara BBC na ha amalitela usoro ịhọpụta ozu 'nke bụ nke' n'ime ihe ruru iri ise gbara ọkụ n'otu ụlọozu dị n'Enugwu Ukwu.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba gwara BBC Igbo na ọkụ gbagburu ozu ruru iri na ise.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti Anambra na-ekwu na ha achọpụtala ihe butere ọkụ a, ebe ndị uweojii na-ekwu na ha mabeghị ihe kpatara ya.

Ọ kwukwara na kọmishọna na-ahụ maka ahụike bụ Joe Akabuike na ndị ọrụ ụlọ ozu azụrụ azụ n'ụlọ ozụ ahụ ahọpụta ozu "nke bụ nke".

Image copyright Anambra state government

BBC Igbo kpọkwara Akabuike onye kwuru na ọ nọ na ya bụ ụlọ ozu ugbua.

O kwuru na ihe butere ọkụ ahụ bụ ahịhịa na-agba ọkụ n'akụkụ ụlọ ozu ahụ.

Image copyright Anambra state government

N'ọnụ ya, "m na ndị ọrụ ụlọ ozu họpụtacha ozu niile a mara nke bụ nke ,ma detuo nchọpụta anyị ọfụma, anyị ebunyewe ya ndị nwe ozu."

"Anyị ga-eji nyocha DNA were chọpụta ozu gbarisiri nke bụ nke."

Image copyright Getty Images

Cheta na Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambara steeti kwuru na ọkụ ahụ gbara ọzu niile dị n'ụlọozu ụlọọgwụ gọọmeti dị n'Enugwu-Ukwu.

O depụtara na akwụkwọ ozi o degara onye ntaakụkọ anyị na ha amabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.

O kwuru na CSP EGU Benjamin si ngalaba uweojii na Nimo du ndị uweojii na-akpagharị n'obodo gawa ebe ihe ahụ mere.

Image copyright Getty Images

Ha gbochiri ọtụtụ mmadụ ịbanye ebe ahụ ga-azuru ihe ndị mmadụ ma kpọkwa ụlọọrụ na-emenyu ọkụ biara menyụọ ọkụ ahụ.

Mohammed kwuru na ozu niile dị ebe ahụ gbatọrọ agbatọ n'ụzọ mmadụ enweghị ike ịmata ozu onye ọwụ.

O kwuru na ruo ugbua ha mabeghị ihe butere ọkụ ahụ mana ya ndị otu ya na-enyocha ihe niile mere ebe ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a