#WalkofWomen: Etu Oby Ezekwesili si chụ nta vootu n'Anambara

Oby Image copyright @Oby2019
Nkenke aha onyonyo Ezekwesili kwuru na oi dị ya ụtọ ka o si enwekorịta mkparịtaụka n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ

Oby Ezekwesili gwara ndị Anambra steeti na obi dị ya ụtọ etu ha si nabata ya n'etiti ha.

O jikwa ohere ahụ were kwuputere ha ka ọ ga-esi mee ka ndụ dịrị ha mma ma ọ banye oche ọnyeisiala n'afọ 2019.

Ezekwesili bidoro atụmaatụ akpọrọ "#walkofwomen" iji wee mee ka ụmụ Naịjirịa ghọta mkpa ọ dị ịgbapụta Naịjirịa n'aka ndị nọ ọchịchị ugbua na ntuliaka 2019.

Image copyright @Oby2019

O buru ya bụ atụmaatụ gawa Onicha ma bie ije na All Saints Primary School Onichaa.

Image copyright @Oby2019
Nkenke aha onyonyo Oby gwara ụmụ Naịjirịa ha tunyerela Atiku na Buhari na ntuliaka na-abịanụ

Oby kwuru na njem a dị ya ezigbo mkpa makana o na-enye ya ohere ịmata ụmụ Naịjirịa ọfụma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: