2018 Highlights: Agbamakwụkwọ ndị akpụ n'ọnụ n'afọ a

Linda Ejiofor na di ya Image copyright @ihuomalindaejiofor/Instagram

Agbamakwụkwọ bụ otu emume na-ebute aṅụrị ebe niile mana ihe dị ịche na-adị na ha.

Iji maatụ, n'ime ndị niile gbara akwụkwọ n'afọ a, naanị ụfọdụ mara ebe niile jijiji.

Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a:

1. Linda Ejiofor na Ibrahim Suleiman

Ndị na-eme ihe onyonyo 'Tinsel' bụ Linda Ejiofor na Ibrahim Suleiman, ji "#ISquared2018" wuo ewu mgbe ha lụrụ onwe ha n'ọnwa Nọvemba.

2. Ọkparaeze Harry na Meghan Markle

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100

Agbamakwụkwọ ha mere ụbọchị 19 nke ọnwa Mee, wuru ewu mere na akọchabeghi maka ya ruo ugbua.

3. Francis Uzoho na nwunye ya

Onye ọgba bọọlụ otu egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa bụ Francis Uzoho, dị afọ 20, gbara nwkụ nwaanyị ya n'Imo steeti n'oge ekeresimesi na Naịjirịa.

4.Gbemi Olateru-Olagbegi na Femisoro Ajayi

#TheGFShow bụ ọzọ wuru ewu mgbe onye ntaakụkọ n'igwe okwu bụ Gbemi Olateru-Olagbegi na onye nchịkọta otiegwu 'Falz' bụ Femisoro Ajayi gbara akwụkwọ.

5. Chris Attoh na Bettie Jenifer

Mgbe ya na nwunye ochie ya bụ Damilola Adegbite gbachara alụkwaghịm, Chris Attoh, onye Gana bụ ome ihe nkiri a ma ama, mere ihe tụrụ mmadụ niile n'anya mgbe ọ lụrụ Betrite Jennifer.

6.Fatima Dangote na Jamil Abubakar

Njịkọ nwa ọgaranya bụ Aliko Dangote nakwa Jamil Abubakar, butere ihe yiri ala ọmajiji n'obodo Legọs.

Nke bụ na o butere ide ji ego bụ Bill Gates, nakwa onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Addo, so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara agbamakwụkwọ a.

7. Priyanka Chopra na Nick Jonas

Priyanka Chopra bụ ezenwaanyị mma nakwa omeihe onyonyo na mbaụwa niile lụrụ onye otiegwu mba Amerịka bụ Nick Jonas na mba India.

Mmemme e mere iji kwado ya bụ agbamakwụkwọ ruru otu izuụka.

Image copyright Instagram/@priyankachopra

Akụkọ ndị ga-amasị gị: