Enugu accidents: Ọdachi a ataala isi 15

Ọkụ agbaala ọdọ gas n'Enugu

Ọkụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

Ka a na-abanye afọ ọhụrụ, ọkụ atapịala keke abụọ ya na ọdọ ebe a na-ere gas eji esi nri n'okporo ụzọ Nike Lake nke dị n'Enugu.

Dịka a na-achọ ihe bidoro ya bụ ọkụ, akụkọ kọrọ na ndị uweojii na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ kere nkwụcha ebe ahụ maka ịgbochi ihe ntụmadị ndị ọzọ nwere ike ị dapụta.

Ndị ọlụọọla Niger Delta ga-amalite ọgbaaghara ọzọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Niger Delta Avengers chiri ochi ka gọọmentị Naịjịrịa tee nkwucha, maa chee aka ghọrọ ha mgbe adighị anya

Otu jikọrọ ndị ọlụọ ọla na Naịja Delta ekwuola na ha ga-amalitekwa ọgbaaghara ọzọ n'igosi iwe ha maka na gọọmenti etiti emejuputaghị nkwa ha kwere.

Ọnụ na-ekwuru ndị otu a bụ General Christ kwụrụ na ndị otu a gụnyere Niger Delta Creek Warriors, Ogunuma Camp of Niger Delta, Niger Delta Republic Seekers na Niger Delta Revolutionary Crusade sị na ha gwa ọha maka ya.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ndị mmadụ ji ọkụ ekwentị ha ahụ ụzọ maka ntuliaka

N'ofesi, gọọmentị DR Kongo emechiela ọbaozi intanet na ụfọdụ obodo ha kemgbe ha mechere ntuliaka onyeisiala n'izu gara aga.

Onye sọ na ya bụ ntuliaka bụ Martin Fayulu sị na gọọmenti ma ụma mechie ya bụ obaozi ka ndị mmadụ ghara ịmata onye meriri n'ezie.

Serena na Roger ga-akwata n'iko hopman tenis

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Serena Williams na Roger Federe weriri asọmmpi Wimbledon na 2012

Ndị uweojii Enugu steeti ekwuola na ihe mberede mere n'ụzo Enugu-Abakaliki ụbọchị Monde ataala isi mmadu ise.

Ọnụ n'ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu kwukwara na ihe mberede a gburu ehi iri na ise, ma meruo mmadụ itoolu ahụ.

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

O kwuru na ihe mberede a mere ebe elekere ise nke ụtụtụ, ka nnukwu ụgbọala bu ehi gbapụrụ n'ụzọ ebe ọ na eze ụgbọala mebiri emebi n'ụzọ.

Ndị uweojii na-agba mbọ ikpochapụ ụgbọala ndị ahụ mebiri emebi ma hụkwa na ụdị ihe a agaghi emezi ọzọ.

Amaraizu kwuru na ihe mberede ọzọ mere na Enugu egbughị onye ọbụla.

Ihe mberede a gụnyere ọgbụgba ọkụ ụgbọala bu gas eji esi nri nakwa ọgbatumtum abụọ na otu ụgbọala n'ụzọ Isuoba lane dị n'Enugwu.

O kwukwara na onweghị onye tufuru ndụ ya na ya bụ ọdachị makana ya na ndị otu nakwa ụlọọrụ na-emenyu ọkụ bịara ozigbo menyụọ ọkụ ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Unicef kwuru sị na ihe ruru ọkara ụmụaka amụrụ n'ime afọ ọhụrụ a ga-anwụ

Ụlọọrụ n'ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ UNICEF agbala afa na-aga amụta ụmụaka dị ọnụọgụ dị puku iri abụọ na ụma echi bụ ụbọchị mbụ n'afọ 2019 na Naịjirịa.

Dika Onye nnọchite anya ndị otu a bụ Pernille Ironside sị kwụọ, ihe karịrị ọkara ụmụ aga amụ n'ụwa sitere na mba asatọ nke Naịjirịa na India chịtara ezigbo aja na ha.

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha Naịjirịa agbalara ndị obodo Baga dị na Borno steeti ama ka ha kwapụ kwapụ na be ha maka agha ha chọrọ ịbuso ndị ọlụọla Boko Haram.

Onye gbara ama a bụ Col. Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjịrịa n'akwụkwọ ọ degara ndị obodo ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

APC napụrụ PDP ọchịchị n'afọ 2015

Ndị ndu otu pati APC etiela mkpụ maka ajọ nkata ụfọdụ mmadụ na-akpa maka ị sepụ ndị Igbo ọnụ n'ara maka ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Onye gbara ama a bụ osote onyeisi oche pati ahu na ọdịda anyanwu bụ Emma Enekwu bụ onye si na ndị ọnụ na-eru n'okwu na agbakeri ala ịma ka aga esi kwọọ ya bụ onye ukwu wara.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Sheikh Hasina emeriela ịbụ onyeisiala Bangladesh

Prime Minista ndị Bangladesh bụ Sheikh Hasina enwetela mmeri ọzọ na ntuliaka ha mere na mba ahụ agbanyeghị na ọ sị na ka ya bụ ntuliaka siri gaa ejucheghị ya afọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Paul Pogba gosiri ihe ojiri bụrụ onye akpu n'ọnụ

N'egwuruegwu, Pogba bụ okwu akwụ n'ọnụ na twitter tata bụ Monde.

Akụkọ na-ekwu na Paul Pogba abụrụla onye mbụ na Manchester United bụ onye nyere opeketempe goolu abụọ n'asommpi abụọ sochi ibe ya azụ kemgbe Disemba 2012.

Gee akụkọ anyi na nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri

Aha onyonyo,

'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze'