Serena Williams: Federer egosila ya na mmadụ ka ibe ya

Srena Williams na Roger Federer

Ebe foto si, Getty Images

Ọpịa bọọlụ a ma dịka ọkaibe na tenis ụmụnwoke na mbaụwa bụ Roger Federer egosila Serena Williams na mmadụ na-aka ibe ya n' asọmpị ha gbara taa bụ Tuzde.

Federer na onye otu ya bụ Belinda Bencic jiri ọkpụ 4-2, 4-3 merie Serena Williams na onye otu ya bụ Frances Tiafoe ka ha zutere n' asọmpi 'Hopman Cup' n'ụbọchị Tuzde na Perth.

Asọmpi 'Hopman Cup' bụ asompi nke mba na mba na-asọrịta nke na-abụ n'etiti nwoke na nwaanyị iji kwado asọmpi 'Australia Open'.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ mbụ Federer na Williams na-asọrịta mpi n'ụwa ha dịka ndị ọpịa bọọlụ.

Williams na onye otu ya bụ nwoke nọchitere mba Amerika, ebe Federer na onye otu ya bụ nwaanyị nọchitere Swizaland.

Tupu a gbaa asọmpi ahụ, Federer na Williams kwuru okwu gosiri na ha abụọ na-atụ onwe ha na anya.

Ihe ndị kwesịrị ịma maka mmadụ abụọ:

Serena Williams

  • O ritela Grand Slam ugboro 23
  • Ọ dị afọ 37
  • O riteruola nde narị dola na ihe nrite na asọmpiFederer na-atụ Serena n'anya.
  • Ọ sị: 'Ndị mmadụ amaghị na Federer bụ ọkpọka.'

Roger Federer

  • O ritela Grand Slam ugboro 20
  • Ọ dị afọ 37
  • O riteruola nde narị dola na ihe nrite na asọmpi

N'akụkọ ọzọ,

Dịka a batara afọ 2019, nwa mbụ a mụrụ n'alaigbo bụ Kamsi Eselu, bụ onye a mụrụ ka o ji naanị nkeji iri abụọ na anọ gafee elekere iri na abụọ (12:24 am) nke ụtụtụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị, na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu Teaching Hospital dị n'Awka, Anambra steeti.

Ebe foto si, Anambra State Government

Nkọwa foto,

Nwunye gọvanọ Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano, kwuru na Kamsi bụ ezigbo onyinye nye ndị Anambara

Gụọ maka ụmụaka ndị ọzọ a mụrụ n'afọ ọhụrụ n'ala Igbo ebe a: First baby: Nwa mbụ a mụrụ n'Alaigbo na 2019

Ndị alakụba gara ụka Kraịst

Ndị otu Islamic Movement of Nigeria bụ ndị otu Ibrahim El-Zakzaky e ji eji, so ndị ụka Katọlik gbakọọ n'ụka afọ ọhụrụ na St Mary's Catholic Church dị na Samaru, Zaria na Kaduna steeti.

Ebe foto si, Getty Images

Onye du ha gaa ije ahụ bụ Ọkamụta Isa Mshelgaru nke Mahadum ABU, kwuru na ọ bụ iji mee ka mmekọrịta dị n'etiti ofufe abụọ ahụ siwanye ike.

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Nọt Koria bụ Kim Jong-Un adọọla aka na ntị na o nwere ike igbanwe ebumnobi ya banyere ịkwụsị nrụpụta ngwaahịa nuklia ma ọ bụrụ na mba Amerịka gaa n'ihu imachibido ha.

Ebe foto si, Reuters

Gee akụkọ BBC na nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Lee etu ndị Igbo si chụọ afọ 2018

Aha onyonyo,

New year eve: Lee ka ụfọdụ ndị Igbo si efere 2018 aka ụla