Amina Zakari: PDP,Ohaneze akatọọla ọkwa Inec nyere ya
Akụkọ dị mkpa taa
Ndị Naijiria akatọọla Inec maka ịhọpụta Amina Zakari
Ebe foto si, @inecnigeria
Amina Zakari, nwa nwanne Onyeisiala Buhari bụbu onye ọrụ ahụike na-ahụ ọkwa ọhụụ ya a
PDP, Ohaneze Ndigbo na ndị ọzọ akatọọla ọkwa dịka onye ga-akpọpụta onye meriri na ntuliaka onyeisiala Inec nyere onye ezinaụlọ Buhari akpọrọ Amina Zakari
Onyeisi ọhaneze bụ NNia Nwodu kpọrọ oko ka Zachari tinye akwụkwọ arụkwaghị n'ihi na nhọpụta ya dịka ọnye ga-achịkọta vootu na 2019 dị ka "Rangers ịhọpụta onye ga-egbu bọọlụ n'asọmpi ha(Rangers) na Kano pillars."
PDP kwuru site n'akara Twitter ha na anya ha dị n'ahụ Yakubu Mahmood onyeisi Inec ịhụ na ọ ga-eme ihe n'ụzọ ziri ezi.
Oby Ezekwesiri kwuru na odoro anya na onyeisi Inec na-eme ihe na ụlọọrụ ya aghaghị ile anya n'ihu eme ihe ha.
Onye nkuzi kwuru na ọkwa ahụ e nyere Amina Zakari edoghi onye ọbụla anya.
A tọhapụla ndị okpukpe Juu e ji eji
Ebe foto si, Getty Images
Atopụla ndị ụka Juu mmadụ iri ise na otu ndị uweojii tụnyere n'ụlọ mkpọrọ maka ime ngaghariwe n'Abia steeti.
Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Revered Peace onye gbara BBC Igbo ama n' ozi o zitere kwuru na ọ bụ ndị ọkaiwu Ipob gbapụtara ha bụ ndị anwụchiri kemgbe abali iri na otu nke ọnwa Disemba.
Ndị agha Naijiria akpọpụtala aha ndị otu ha nwụrụ n'ụgbọelu Boko Haram gbaturu
Ebe foto si, Nigeria Army Twitter
Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kemgbe afọ 2015.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Ibikunle Daramola wepụtara, o kwuru na ndị agha ise nwụrụ na ya bụ ụgbọelu nke dara oge ha na ndị Boko Haram na-akwata n'Ugwu-Awusa.
Dịka Daramola si kwuo, "ndị nwụrụ ma bụrụkwa ndị ahụrụla ozu ha bụ Flight Lieutenant Perowei Jacob - onye na-akwọ ụgbọelu ahụ; Flight Lieutenant Kaltho Paul Kilyofas - onye so akwọ ụgbọelu ahụ; Sergeant Auwal Ibrahim- onye ọrụ ụgbọelu; Lance Corporal Adamu Nura nakwa Aircraftman Meshack Ishmael."
Ụlọọrụ ntaakụkọ AFP kwuburu na ndị Boko Haram ahụ agbajiela ndịagha Naịjirịa aka ma chụpụ ha na ọnọdụ atọ ebe ha nọ na Borno Steeti ụbọchị Tuzde.
Ndịagha ụgbọelụ Naịjirịa kwupụtaburu na otu ụgbọelụ ha jị alụ agha Boko Haram na Damasak, Borno steeti efunyụọla anya pịị.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Ibikunle Daramola kwuru nke a na-akara Twitter ha.
Ohere ịchụta ego na Naijiria esiwanyela ike
Naijiria agbadala na ngụkọ obodo kacha mma ịchụ nta ego na mba ụwa rue ọkwa otu narị na iri.
Niajiria sị n'obodo nke atọ n'afrika n'afọ 2018 gbadara rue mba nke iri na anọ dịka ngụkọ nke ụlọọrụ ntaakụkọ Forbes siri kwuo.
Ụlọikpe ajụla arịrịọ Dino Melaye
Ebe foto si, Getty Images
Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla inye ndị uweojii wakporo ụlọ Dino Melaye iwu ka ha hapụ ụlọ ya.
Melaye gbara akwụkwọ ịrịọ ụlọikpe ka ha nye ndị uweojii iwu ka ha sị n'ụlọ ya pụọ mana Okaikpe Maha nyere mkpebi ka anụ ikpe ahụ ngwa ngwa.
Ikpe ndị gburu Jamal Khasoggi amalite
N'ofesi, e bidola ikpe mmadụ iri na otu ana-ebo ebubo na ha gburu onyentakụkọ Jamal Khasoggi na mba Saudi Arabia.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egwuregwu Man city na Liverpool na-ezute onwe ha ụbọchị Tọzde n'asompị Premier League.
Ọ bụru na Man. City emerighị n'asompi a Liverpool ga-eji pọint itoolu aga ha.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ọkụ bara n'ahịa n'Umuahia
Ọkụ gbara Ahịa Timbershade dị n'Enugwu
Ndị ahịa Aba Motor Park dị n'Umuahia akwaala arịrị maka ọkụ gbara ụlọahịa ha n'ụbọchị Wenzede.
Ka a na-ama imi n'ala ịmata ihe kpatara ya bụ ọkụ, akụkọ na-akọ na ọ bidoro n'otu ụlọahịa ebe adowara mmanụ ụgbọala.
INEC n'Enugwu ewepụtala akwụkwọ gosiri ka ntuliaka 2019 ga-adị
Ebe foto si, AFP
Inec: Bia nara PVC gị
Akwụkwọ a kwuru na ntuliaka Onyeisiala na ndị ndị omeiwu ga a bụ na mkpụrụ ụbọchị iri na isii nke onwa Febuary afọ a (Feb 16).
N'ofesi, China sị na ụgbọelụ satilite nke ha kpọrọ Change 4 adaala na oteaka n'elu ọnwa
Ebe foto si, Twitter/CGTNOfficial
Ụgbọ eluigwe ndị China
Ụgbọelụ satilite nke ọnweghị onye na-anya ya gbara ụkwụ na ya bụ ọdịda anyanwụ ọnwa mgbe ọkụrụ elekere irị na ụma na Beijing.
Gee nkeji a ebe a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị nke taa ebe a:
Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ