Akụkọ dị mkpa: Atiku akatọọla atụmatụ 'State of Emergency'
Akụkọ dịmkpa
Atiku sị na ekwenyeghi maka atụmatụ "State of Emergency" Na Zamfara
Ebe foto si, Reuters
Onye na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa n'okpuru Peoples Democratic Party bụ Atiku Abubakar ekwuola na atụmatụ itinye ọnọdụ Bekee kpọrọ "State of Emergency" Na Zamfara na Katsina steeti ezighiezi.
Agbanyeghi na gọọmentị etiti ekwubeghi na ọ ga-etinye ọnụdụ a na steeti ndị a, aka na-achi Zamfara bụ Abdulaziz Yari ekwuola na ọgbaghara na-eme ebe ahụ karịri ike ya. Ebe ogbo ya na Katsina bụ Aminu Bello Masari sị na ndi omekome nweziri ọnọdụ na steeti ya.
Dina Melaye enyefela ndị uweojii onwe ya
Ndị uweojii na-enyocha Dino maka ebubo gbasara ogbugbu mmadụ na ohi
`Sineto Dino Melaye na-anọchite Kogi-West n'ụlọomeiwu enyefela onwe ya ndị uweojii ka abalị asaa gachara ha ji wakporo ụlọ ya n'Abuja.
Ndị uweojii na-achọ ya maka ebubo gbasara ogbugbu mmadụ nakwa ohi.
Mbọ Melaye gbaburu isiị n'ikike ụlọikpe chụpụ ha kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọikpe jụrụ ịza ekpere ya.
Ndị uweojii chọrọ ka Melaye bịa zara ọnụ ya banyere
Ụmụ Naijiria akatọọla NANS maka ọgbakọ ha na Buhari
Ebe foto si, @AsoRock
Ụmụ Naijiria akatọla otu jikọrọ ụmụakwụkwọ bụ NANS maka ịkpụ ụkwụ n'ala n'okwu gbara Abụbọọrụ ndị nkuzi imahadum nke a kpọrọ ASUU na bekee na-eme.
NANS na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ ụbọchị Tọsde mana ha kwuru na otu ahụ hapụrụ okwu gbasara ọnọdụ agụmakwụkwọ , kwuwe maka nkwado ha ga-enye Buhari na ntuliaka 2019.
N'ofesi,
Ebe foto si, Getty Images
Angela Merkel bụ onyeisiala mba Germany
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Leon Balogun, onye ọgba bọolụ Naijiria si German League banye Premier League ekwuola na obi dị ya mma etu ịgba bọọlụ n'asọmpị Premier league si mara la ya ahụ ọfụma na egbughị oge.
Ụmụ nwaanyị ga-eso na "Direct Short Service" nke ndị agha Naịjirịa
Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa ga-amalite ịwe ụmụnwaanyị na otu ọzụzụ ndị agha akpọrọ Direct Short Service Course taa bụ ụbọchị anọ nke Jenụwarị agbanyeghị ndọrọndọrọ ya na ya so.
Chete na kemgbe 2017 na emechiri ịnye ụmụnwanyị ọzụzụ a maka ịgbọchị nwaanyị ị bụ onye ndụ ndị agha n'ihu agha.
Ndị Omeiwu obele n'Amerịka ebinyere aka n'iwu mgbaghe gọọmentị
Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu US ebiele nkwa n'ike ebe ha binyere aka n'akwụkwọ ka onyeisiala Trump nwee ike ịwepụta ego o ji arụ ọrụ ma ghara ịnye ya ego ọchọrọ maka mgbaaja Mexico.
Chete na ndị kwe ndị ekweghị dị gbasara ego mgbaaja Mexico kwụsịrị ọrụ na mba US ebe Onyeisiala Trump sị na ya ga-eji ikike onwere dịka onyeisi dọrọ ya bụ ego ma ndị omeiwu achọrọ ya ma ha achọghị ya.
N'egwuruegwu,
Ebe foto si, AFP
Manchester City gbara Liverpool ọkpụ abụọ asatara otu na asọmmpị Premier lig nke ụbọchị Tụzde. Aguero na Sane nyere goolu abụọ a.
Mmeria mere ka Manchester City gbawazia ndị nke abụọ n'ogogo Premier lig ma meruo ọgwụ ndị Liverpool nke mere na emeribeghị ha na asọmmpị iri na abụọ (20) ha gbagoro.
Gee Akụkọ ndị a ntị ebe a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
'Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri'