"Onye ọbụla zuru ọbante nwaanyị chọrọ ịgbu ya" - Ndị uweojii
Akụkọ dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
"Ọnye ọbụla zuru peteri maọbụ ọbante nwaanyị chọrọ igbu ya"
Ọ bụ ihe a ka ọnụ na-ekwuchitere ndịuweojii na Legọs steeti Dolapo Badmus kwuru gbasara akụkọ a na-anụ na ndịmmadụ na-ezu ọbante ụmụ nwaanyị ma jiri kwa ya gwọọ ọgwụ ego.
O kwuru na ebe ndị a na-ezu ọbante ha na-anwụ, na ndị na-ezu ha abụghị ndị ohi kama ndị na-achọ ịgbu mmadụ.
N'ọwụwa anyanwụ
Ebe foto si, Ebonyi State Governement
Rụọ nụ ọrụ 'egwu eke' ọfụma
Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi agwaala ndịagha ha siri ụzọ ziri ezi we rụọ ọrụ egwu eke nke ha malitere n'ọnwa jernụwarị.
O kwurukwara na ndịagha chọọ ụzọ ha ga-eji metuo obi ndị ọwụwa anywanwụ iji mee ka olileanya atụkwasiri ha gbalite.
N'ofesi
Ndị uweojii ebidola nyocha n'etu nwaanyị amaghị onwe ya ihe ruru afọ iri nọ n'ụlọọgwụ siri tụrụime mụọ nwa na nwgụcha ọnwa dizemba afọ 2018.
Ụlọntaakụkọ CBS kwuru na nwa ọhụrụ ahụ gbasiri ike nakwa ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ amaghị na nwaanyị mmadụ dị ime.
N'egwuregwu
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick agọọla akụkọ kwuru na onyeisiala Muhammadu Buahari enyela iwụ ka eme ya nyocha maka mpụ ego. Ọ gọkwara na amachịrị ya ịme njem maka ya bụ nyocha.
Gee Nkeji ebe a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Inec ekweghị ịwepụ Amina Zakari
Ndị ọrụ Inec gosikwara njikere ha dị ibido ihe ha bịara
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec asala PDP na pati iri itoolu ọzọ chọrọ ka ewepụ Amina Zakari dịka onye nhazị ebe a ga-anọ gbakọ ọnụọgụgụ vootu atụrụ na mbinye aka nke eji ahụpụta onyeisiala.
Inec kwuru na onye ikike mkpokọta vootu dị n'aka bụ onyeisioche Inec bụ Mahmud Yakubu, nke mere na-enweghi ike inye onye ọzọ ohere ime ya bụ mgbakọ ikpeazụ.
Inec sị na ọrụ Zakari emetutaghị ịgụ vootu, kama na ọ bu ihazi ebe a ga-anọ mee ya bụ mgbakọ.
Gọọmentị na NLC ekwetebeghị maka ọgwọ ọnwa opekatampe
Ebe foto si, @LABOURMINNG
Nzụkọ ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress na gọọmenti etiti nwere achitaghi aja enwereike kpọọ aha.
Chris Ngige, bụ minista na-ahụ maka ọrụ gwara ndị ntaakụkọ na NLC na gọọmenti ga-ezute ọzọ n'ụbọchị Monde na-abịa. O kwukwara na mkaritaụka ha maka ọgwọ ọnwa opekatampe na-aga n'ihu nke ọma.
N'ofesi,
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha
Onyeisiala Amerika bụ Donlad Trump na ndị omeiwu Demokrat ka na-ama akwa aka banyere mgbidi ọchọrọ iru n'oke ha na mba Mexico.
Trump kwuru na ya dị njikere ka mgbachi ụfọdu ụlọọrụ gọọmenti bụ ihe ndọrọnndọrọ a butere bụrụ ihe ga-aga n'ihu. Ọsịkwa na ya nwereike tinye ihe Bekee kpọrọ national Emergency maka nke a.
Maradona apụtara n'ụlọ ọgwụ
Ebe foto si, Getty Images
Onye ama ama n'egwuregwu bọọlụ bụ Diego Maradona apụtara n'ulọọgwụ ebe ọnatara ọgwụgwọ maka ọbara na-agba ya n'afọ.
Ada Maradona aha ya bụ Dalma sị na nna ya dị mma.
Ụjọ bara ndị na-akwado Maradona ahụ mgbe akuko pụtara na enyere ya akwa n'ụlọọgwụ mgbe achọpụtara na ọbara na-agba n'ime afọ ya.
Gee akụkọ ndị a ebe a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile