Daily Trust: Ndịagha Naịjirịa agbachiela ụlọọrụ ha abụọ

Akụkọ dị mkpa

Uthman Abubakar na Ibrahim Sawab

Ebe foto si, Uthman Abubakar/Ibrahim Sawab/Facebook

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ ndịagha Naịjirịa awakpoola ụlọọrụ ndị ntaakaụkọ Daily Trust nke dị na Borno steeti.

E kwukwara na anwụchiri onyeisi ha bụ Uthman Abubakar nakwa otu onye ntaakaụkọ bụ Ibrahim Sawab.

Ebe foto si, Daily Trust

N'otu aka ahụ ndịagha Naịjirịa gakwara n'ụlọọrụ ha nke dị n'Abuja kwakọrọ ngwaọrụ ha ma gwa ndịọrụ niile ha gbadaa n'ala n'ụlọ ebe ụlọọrụ ha dị.

Otu onye n'ime ha achọghị ka a mara aha ya gwara BBC n'ekwentị na ndịagha nwuchiri mmadụ abụọ n'ime ha.

O kwuru na o nwereike ị bụ maka akụkọ ha dere taa gbasara ọrụ ndịagha na etu o si aga n'ugwu awụsa Naịjirịa.

"Anyị na-agbalị ịnweta ndịagha n'ekwentị ịjụ ha ihe anyị mere ha jiri gbachie ụlọọrụ anyị mana ha ekweghị aza anyị" bụ ihe o kwukwara.

BBC na-agbalịkwa ịnweta ndịagha nụrụ olu ha gbasara okwu a mana o nwebeghị isi.

Ọzọ,

Ndịuweojii n'Ogun steeti anwụchiela ụmụnwoke anọ bụ ndị bu egbe aga ohi n'ụlọụka dị icheiche na gburugburu steeti ahụ.

Na mba ofesi,

Dịka agbachiri isiụlọọrụ gọọmentị mba Amerịka, onyeisiala ahụ bụ Donald Trump ka kwụsike na-ekwu na ọ gaghị agbanwe uche ya gbasara ịrụ aja ga-ekewa oke mba Amerịka na mba Mexico

N'egwuregwu,

Amaju Pinnick bụ onye ndu otu egwuregwu bọọlụ Naijiria ekwuola na ha ga-akwaod ịzute onye ọgba bọọlụ bụ Victor Moses iji nwee nzụkọ ga-eme ka o si n'ezumike ọ bara laghachite n'ịgbara Naịjirịa bọolụ

Akụkọ BBC Igbo na Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Onye na-azọ oche osote onyeisiala n'okpuru ọchịchị pati PDP bụ Peter Obi ekwuola mkpa ọ dị iwere akụ na ụba Naijiria dozie ndụ ụmụ Naijirịa.

O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'ụlọụka " House on the rock" dị na Lagos.

Obi kwuru na ụmụ Naịjiria enweghị obodo ọzọ ma ọbụghị Naijiria ma rịọkwa ka Chukwu metụ obi ndị nọ n'ọchịchị aka ka ha mee ka ihe dịrị ụmụ Naịjirịa mma.

O kwuru ka onye ọbụla bụ onye Naịjiria na-kpere obodo a ekpere.

Na ngwucha, Obi kwuru na ọ bụrụ na ndị ọchịchi wulite Naijirịa, ụmụ anyị na-abịanụ ga-eri uru ya kwa mgbe kwa mgbe.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Egbuola ọtụtụ ndị otu uka Krist na mpaghara ugwu hausa

Otu jikoro ndị na-ekpe ụka Kraịst na Naịjirịa a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) na bekee ewepụtala ụbọchị Jenụwari iri,

dịka ụbọchị ụmụ Naịjirịa ga-ekpe ekpere maka ntuliaka kwụ ọtọ nke ga-eme n'afọ a nakwa ntọghapụ Leah Sharibu.

Samson Olasupo Ayokunle onye degara ndị ntakụkọ ozi a kwuru na emume a ga-enye ụmụ Naịjirịa ohere iji rịọ chukwu ka onye ha ndị ọchịchị dịmma ma na-atụkwa egwu Chineke.

N'akụkọ ọzọ,

Ebe foto si, Empics

Otu onye so chọpụta otu "Arewa consultative forum" bụ Tanko Yakassai ekwuola na ndịIgbo agaghị enweta oche onyeisiala ruo afọ iri abụọ na asatọ,

maọbụrụ na onyeisiala Muhammadu Buhari merie na ntuliaka 2019.

Yakassai gwara ndị ntaakụkọ SUN mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ.

N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images/afp

Mba Saudi Arabia ewepụtala iwu ga-enye ụmụnwaanyị mba ahụ ikike ịmata mgbe dị ha gbara ha alụkwaghịm n'ụlọikpe.

Tupu ugbua ụmụnwoke mba ahụ na-agba nwunye ha alụkwaghịm na nzuzo n'agwaghị ha agwa.

Cheta na otebeghị aka mba ahụ nyere ụmụnwaanyị ha ikike ịnya ụgbọala kamgbe amachiri ha ruo afọ iri.

N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images

Kamgbe akụkọ pụtachara na ọgba bọọlụ Super Igụlụ bụ John Mikel Obi ahapụla otu egwuregwu China akpọro Tianjin Teda n'anọzughi oge ya na kwekọrịtara na ọ ga-anọzu,

ndị mmadụ na soshal media atụwarala ya alo otu egwuregwu bọọlụ ọ ga banye ọzọ ebe ụfọdụ gwara ya lata bara otu egwuregwu Naijirịa uru.

@ScottEaglen na-arịọ ka ọ gawa West Ham.

@Isa_Babagana kwuru ka ọ lawa Naijirịa ga nọnyere otu na-ekpokọta ndị bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ bụ Nigeria Professional Football League(NPFL).

Nkeji taa

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo,

Ihe dị iche n'Ozalla