Nigeria Election 2019: Ihe a na-ekwu maka Peter Obi n'obodo ya

Nigeria Election 2019: Ihe a na-ekwu maka Peter Obi n'obodo ya

BBC Igbo gara Agụlụ n'Anambara steeti bụ obodo Peter Obi, onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'okpuru pati PDP.

Ndị ha na Obi so gụọ akwụkwọ site na Praịmarị ruo ma mahadum, kwuru ihe ndị dị ịtụnanya gbasara ya, nke bụ bụ na a mara ya dịka "Okwute"

N'okwu ha, ọ malitere ịchụ ego dịka nwa akwụkwọ praịmarị, oge ọ na-ana ha ego tupu ọ rụọrọ ha ọrụ ha kwesiri ịrụ.

Ha kwukwara na ọ bụghị onye kwenyere n'inye mmadụ ego, mana ọ bụ onye ga-akwado gị n'ọrụ ị na-arụ ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ ziri ezi.

Ha kwuru na ọ bụghị onye na-emefu ego.

Ndị kwuru okwu n'ihe onyoonyo a bụcha ndị enyi ya n'ụlọakwụkwọ na

  • A mụrụ Peter Gregory Obi n'Ọnịcha na 19 July 1961.
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ Praịmarị Sancta Maria Primary School Onitsha nakwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Christ the King College, Onitsha.
  • O nwere ụmụnne anọ.
  • Ọ gara mahadum University of Nigeria, Nsukka (B.A), Lagos Business School, Nigeria, Harvard Business School, Boston, London School of Economics, Columbia Business School, New York nakwa Institute for Management Development, Switzerland
  • A ma ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị na onye oji ego achụ ego.
  • Ọ bụ osote Atiku Abubakar na ntuliaka 2019 n'okpuru otu patị People's Democratic Party PDP.
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ododziakụ Margaret Brownson Usen n'afọ 1992. Ha mụrụ ụmụ abụọ.
  • Na 24 Maachị ka o kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala Naịjirịa.