MC Oluomo: Ọgbaghara dapụtara n'achụmnta vootu APC na Legọs

Akụkọ dị mkpa:

A gbaala ndị ntaakụkọ abụọ egbe na Legọs

Ebe foto si, BBC/Tope Ogunbanke

Mgbọ tụrụ otu n'ime ndị ntaakụkọ si n'ụlọọrụ 'New Telegraph' bụ Tope Ogunbanke nakwa Emmanuel Oladesu si n'ụlọọrụ 'The Nation'.

Nke a mere dịka ọgbaghara dapụtara n'ọgbakọ achumta vootu ndị APC mere maka ọkwa gọvanọ nke Babajide Sanwo-Olu na-azọ.

Otu onye ntaakụkọ ya na Ogunbanke na-arụ ọrụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na mgbọegbe tụrụ ogbo ya n'agba.

N'aka nke ọzọ, mgbo tụfrụ Oladesu n'isi, ha abụọ natara nleta.

A sụrụ Musiliu Akinsanya a ma dịka MC Oluomo mma na ọgbaghara suru n'etiti ndị agboro dị iche na ndị na-eso MC Oluomo ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụkwara ahụ.

Onye bụ MC Oluomo?

MC Oluomo bụ onyeisi ndị agboro n'Oshodi, Legos.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị otu NLC chọrọ ka gọọmenti etiti kwụwa ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruru puku naịra iri atọ

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii nọ na Legos na-achọ otu onyeisi ndị agboro a kpọrọ Mustapha Adekunle onye a na-etu 'Seigo.'

Ha na-ebo Seigo ebubo ibute ọgbaghara ahụ nakwa ikposaa ọgbakọ achụmta vootu APC mere.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti kwuru na ọ bụ Seigo na ndị otu ya bulitere ọgbaghara ebe "a nọrọ maa MC Oluomo mma, e buga ya Eko Hospital ebe ọ na-enweta nleta."

Oti kwukwara na ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ maka ihe mere.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ya

Wunderkid kwuru na ihe a mere ga-eme ka ọ ghara ịpụta n'ụbọchị ntụlịaka.

Ebe Okeybams kwuru maka ụjọ ji ya n'ịlaghachi be ya

N'Enugwu taa

Ndị njem ụgbọelu tọrọ n'ọdọụgbọelu Enugwu n'ụbọchị tuusde dịka ụgbọelụ Arik efepụghị n'ihi ihu eluigwe adịghị mma.

Airpeace gburu oge otu awa tupu ha efepụ n'ụtụtụ a.

Ebe Ethiopian Airline gbukwara oge ma ha na-abanye ụgbọelu dịka ozi a na-apụta.

Ndịagha Ụgbọelu

Nkọwa foto,

Akwamozu ndịagha ụgbọelu Naijiria nwụrụ n'ọdachi ụgbọelu

E mela akwamozu ndịagha ụgbọelu Naijiria ise nwụrụ n'ọdachi ụgbọelu ụbọchị Tuzde n'a National Hospital dị n'Abuja.

Perowei Jacob,Kaltho Paul Kilyofas, Auwal Ibrahim, Adamu Nura, Meshack Ishmael, nwụrụ n'agha ndị agha megide Boko Haram na Borno n'abali abụọ nke ọnwa Januwari.

N'ofesi,

Mba Amerịka amachiela mba venezuala ka ọ fọrọ abali abụọ ka onyeisiala Nicolas Madura banye n'ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ.

Odeakwụkwọ maka agbaego mba Amerịka kwuru na ọtụtụ ndị nọ ndị ọchịchị nso na-ekpori ndụ, ebe ndị ala ha na-ata ahụhụ.

N'egwuregwu,

Ebe foto si, Egypt FA

A họpụtala Egypt dịka mba ebe a ga-ehiwe asọmpi iko Afrika bụ AFCON nke afọ 2019.

Cheta na ahọpụtaburu mba Kamerun mana ha adịghị njikere eji napụ ha ikikere ị hazi ya bụ asọmpị.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Abụbọ-ọrụ ndị ASUU ọ ga-akwụsị?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Ụmụakwụkwọ mahadum etiela ebewu dịka otu jikọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU ekwuola na ha ga-enyocha nkwa ọhụrụ gọọmentị kwere ha tupu ha akwụsị abụbọ ọrụ.

N'aka nke ọzọ, otu jịkọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC na-akwado ime ngagharịiwe n'ihi oge gọọmentị na-egbu n'izigara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ụgwọ opekatampe ọhụrụ.

N'akụkọ ọzọ,

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị otu NLC chọrọ ka gọọmenti etiti kwụwa ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruru puku naịra iri atọ

Otu jikọtara ndị isi ntaakụkọ bụ "Nigerian Guild of Editors" akpọọla oku ka ndịagha Naịjirịa tọhapụ ndị ntaakụkọ abụọ ha nwuchiri na mwakpo ụlọọrụ mgbasa ozi Daily Trust.

Onyeisi ndị otu a bụ Funke Egbemode kwuru na mwakpo a ndị agha mere bụ ihe agba ochie na-ekwesighi ime n'oge ọgbara ọhụrụ a.

Na mba ofesi,

Ebe foto si, Gabon TV

Egbuola ndị agha mmadụ abụọ n'ime mmadụ ise chọrọ ịnaara ọchịchị n'ike na mba Gabon n'ụbọchị Monde.

Ụlọọrụ onyeisiala ha bụ Ali Bongo kwuru na a nwụchiela mmadụ atọ ndị ọzọ ebe udo ewerela ọnọdụ na mba ahụ.

N'egwuregwu,

Ebe foto si, @CAF_Online

Taa ka aga ama ndị ga-abụ ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka nke ụmụnwoke n'etiti Mohammed Salah, Sadio Mane na Pierre-Emerick Aubameyang.

Ebe ndị nke nwaanyị bụ n'etiti Fransisca Ordega, Asisat Oshoala na Chrestina Thembi Kgtlana.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile