Akanu Ibiam International Airport: Arik akagbuola ifepụ n'ọdọugboelu Enugwu

Akanu-Ibiam Airport Enugwu

Ụkwụ tọrọ ndị njem ụgbọelụ chọrọ ịbanye Arik si ọdọụgbọelu Akanu Ibiam International Airport, Enugwu gawa ebe dị iche iche na Naijiria n'ụzọ taa bụ Tuzde n'ihi na a kagburu njem ha.

Ndị ọrụ Arik ndị mara ọkwa ịkagbu njem ụgbọelu ha ka ọ gachara awa atọ ụgbọelu ndị ahụ kwesịrị ifepụ kwuru na ọ bụ n'ihi na ihu eluigwe adịghị mma.

Ha kwukwara na ha amaghị oge ihu eluigwe ga-agbake.

Nkagbu ahụ hapụrụ ọtụtụ ndị njem n'ọnọdụ ṅgara-amara dịka ha na-eche ihe ha ga-eme onwe ha.

Otu onye n'ime ha nyere aha ya dịka Nenye gwara BBC Igbo na ya na ụmụ ya anọ kwesịrị isi Enugwu gawa Abuja ebe ha ga-abanye ụgbọelu gawa ala Bekee n'uhuruchi ụbọchị Tuzde.

Nenye kwara arịrị na ịkpọ ụmụ ya na ibu ha ga gbaa okporoụzọ gawa Abuja ga-enye ha nnukwu nsogbu.

Ozi BBC nwetara na ụgbọelu Arik nke si Lagos gawa Enugwu n'ụtụtụ taa efetughị n'ihi otu nsogbu ahụ.

Adịghị mma ihu eluigwe metụtakwara ụgbọelu ndị ọzọ.

Airpeace gburu oge otu awa tupu ha efepụ n'ụtụtụ a.

Ethiopian Airline gbukwara oge ma ha na-abanye ụgbọelu dịka ozi a na-apụta.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara