Forbes: Dangote kachasị, Adenuga na-eso ya na ngụkọ onye ka nwe ego n'Afrika

Akụkọ dị mkpa:

Aliko Dangote

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Aliko Dangote bụ onye nwe Dangote Cement na ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche ichedịka ndị ọgaranya ndị ọzọ na-eme

Dịka ngụkọ akwụkwọ akụkọ Forbes siri gosi, Dangote bụ onye kachasị nwee ego n'Afrịka dịka o nwere ihe ruru ijeri dọla iri na ụma ($10.3b).

Ebe onye na-eso ya bụ Mike Adenuga, onye nwere ijeri dọla itoolu na ụma.

Mana Dangote ji ijeri dọla abụọ gbatuo n'ihe ọ dara n'afọ gara aga, n'ihi ọnụ Dangote Cement n'ahịa ego Naijiria dara ada, mana Mike Adenuga si na ijeri dọla ise ọ dara n'afọ gara aga gbalite ihe ọ dara.

Ndị ọzọ bụ:

3. Nicky Oppenheimer - $7.3 billion

4. Nassef Sawiris - $6.3 billion

5. Johann Rupert - $5.3 billion

6. Issad Rebrab- $3.7billion

7. Nagruib Sawiris $2.29 Billion

8. Koos Bekker $2.3 billion

8. Isabel dos Santos $2.3 billion

8.Strive Masiyiwa $2.3 billion

8. Patrice Motsepe $2.3 billion

Adekunle Gold and Simi Wedding: Ọ bụ gịnị ka e jiri kpụrụ ha n'ọnụ?

Ebe foto si, Simi/Twitter

Akụkọ kpọtụrụ ụbọchị Wenezde bụ alụmdịnanwunye mere n'etiti otiegwu Adekunle Kosoko a ma ama dịka Adekunle Gold, nakwa ogbo ya bụ Simisola Bolatito Ogunleye, onye ama dịka Simi.

Adekunle Gold na Simi mere alumdinanwunye nzuzo ebe ha kpọrọ naanị ndị enyi ha mmadụ narị atọ oku gụnyere ndị ama ama na Naijiria.

E ji egwu, "Sade" nakwa "Orente" mara Adekunle Gold, ebe e ji "Jamb Question" na "Love Don't Care" mara Simi.

Ozi pụtara bụ na ndị egwu abụọ a hiwere ụbọchị agbamakwụkwọ ha n'otu ụlọoriri dị na Victoria Island, Legos ebe ha kpọrọ naanị mmadụ narị atọ bịa soro ha nụrịa.

Akụkọ alumdinanwunye ha kpanyere ọkụ na soshal midia.

Ụfọdụ na-ekwu na alumdinanwunye ha ga-agbawa Falz, onye ọzọ na-eti egwu, obi.

Falz n'onwe ya tinyere foto nwata anyammiri na-apụ n'anya n'igwe ogwu Twitter ya dịka akụkọ ahụ na-ewu.

Ndị mmadụ na-esi imi n'ala ịhụta foto maọbụ onyonyo ihe mere n'emume ahụ.

Ndị ihe ha na-amasị dịka @ịamogpaschal na-ekwu na o meghị ha na mberede n'ihi na ha matara na o nwere ihe na-aga n'etiti ha.

#Amaechitapes

Gọọmentị etiti ekwuola na iwepụta ihe e kwuru bụ olu Rotimi Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem, ebe ọ na-akatọ gọọmentị, agaghị ebute ọgbaghara n'etiti ndị APC.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015

Ebe ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa na gọọmentị etiti enweela nkwekọrịta na Onyeisiala Buhari ga-ezigara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ ha ga-etinye n'iwu, nke ga-eme ka a malite ịkwụ puku naịra iri atọ dịka ụgwọ opekatampe, n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke Jenụwarị a.

N'akụkọ ọzọ,

Osinbajo chọrọ iwu ga-ejichi soshal midia

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọ ga-adị mma iwepụta iwu ga-achịkwa igwe okwu soshal midia iji beleta nsogbu akụkọ ụgha.

Osinbajo onye kwuru nke a n'ọgbakọ akụkọ ụgha nke BBC hiwere n'Abuja n'ụbọchị Wednesde kwuru, "ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere gbasara akụkọ ụgha, o nweghịzị ihe a ga-ekweta na ọ bụ eziokwu n'obodo Naịjirịa."

Jamb ekwuola na ndị nwere nsogbu 'biometrics' ga-anọ n'ụlọrụ ha mee ule ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum

Ngalaba na-ahụ maka ule ịbanye mahadum bụ Jamb enyela iwu na ụmụakwụkwọ nwere nsogbu banyere ihe e jiri mara onye nke a kpọrọ biometric data' ga-eme ule nke ha n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Ọnụ na-ekwuru ndị Jamb bụ Fabian Benjamin kwuru na nke a bụ iji gbochie ndị ji aghọghọ na-ekwu na ha enweghị nwụ ike idebanye aha ha iji nwe ohere iti mkpu ka e higharia ule nke ha.

N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Otụtụ mmadụ nọ n'elu facebook na mba uwa

Ụlọọrụ Kọmishiona mgbasaozi nke mba Briten adaala ụlọọrụ Cambrige Analytical nha maka kpụ ụkwụ n'ala na'ịkwụ nha puku paụnds iri na ise maka ịda iwu ichekwa akara ndị mmadụ (data protection Act.

Ebee ka Victor Moses kwụ akwụ?

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọgba bọọlụ Naijiria bụ Victor Moses gara ezumuike site n'ịgba bọọlụ mba ụwa, ọnọdụ ya edozighị anya dịka o nwere ike ịhapụ otu Chelsea.

Moses gbara Chelsea ofuma na afo bọọlụ abụọ gara aga oge Antonio Conte na-achịkọta Chelsea.

Mana n'afọ ọhụrụ a, ọ pụtara naanị ugboro abụọ n'ime asọmpi iri abụọ na otu nke premier league,dịka onye nchịkọta ha ugbua bụ Maurizio Sarri, sị na ya amaghị ije ya.

Ndị agha Naịjirịa atọghapụla onye ntaakụkọ Daily Trust bụ Uthman Abubakar, ha nwụchiri n'ụlọọrụ ha na Maiduguri, mana ọ ka fọrọ.

Ebe foto si, Uthman Abubakar/Ibrahim Sawab/Facebook

Onyeisi ụlọọrụ Daily Trust bụ Mannir Dan-Ali, kwuru na ndị agha ka ji ekwentị Abubakar nakwa kọmputa ya.

N'ofesi,

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ka na-ebe akwa ego o ji arụ mgbidi ahụ aja ọ chọrọ iji egbochi ndị mbịarambịara ịbata na mba ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

N'ihe bụ okwu mbụ ọ na-agwa ndị mba ya n'ihe nkiri n'afọ a, Trump kwuru na a ga-esi n'ihe a kpọrọ North American Free Trade Agreement kwụọ ụgwọ mgbidi a.

N'egwuregwu,

Mohamed Salah nke Ijipt atụrụla ugo dịka ọkaibe n'egwu bọọlụ Afrịka.

Ebe otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa zọrọ Naịjirịa ihu site n'inweta nturu ugo mba bụ ọkaibe n'Afrịka na nturugo CAF.

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị

Chukwuemeka Afigbo na-arụ na Facebook chọrọ ka ị mụta etu esi abụ ọkaibe n'ihe gbasara teknụzụ.

Aha onyonyo,

'Etu ị ga-esi kwalite ọrụ teknụzụ gị'