Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

Akụkọ dị mkpa

Ọkụ anapụla agadi nwaanyị ebe obibi

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

Ezinaụlọ Benedett Okeze ndị Ezimo dị n'okpuru ọchịchị Udenu Enugwu steeti, nọ na nnukwu anyammiri na ịta nkịkịrị eze n'ihi nnukwu ọkụ gbapịara ụlọ ha kpamkpam.

Oge BBC Igbo gara ebe ihe mberede mere wee chọpụta na ọkụ ahụ malitere oge ọkụ latrik bịara n'uju gafee oke n'ime nderị, wee malite gbaba ọkụ.

Agadị nwaanyị Benedette onye nwere nsogbu n'akpịrị enweghị ike itinwu mkpu oge ọkụ ahụ malitere.

Ọ bụ nwa nwa ya dị afọ 13 gbapụrụ kpọta ndị agbataobi nyere ya aka dọpụta nne nna ya n'ọkụ.

Ọtụtụ ndị Amaogbele Ezimo kọwara na ngwangwa ọkụ latrik biafere one, ọtụtụ mmadụ gara wepụsịa ọkụ ha ebe ọtụtụ ngwongwo eji ebi n'ụlọ dịka TV, Fridge, Fan Bulb na ndị ọzọ gbakwara ọkụ.

Reuben Okeze bụ ọkpara agadi nwaanyị ahụ onye kọwara na ọ bụ naanị nwa ya nwoke gbara afọ 13 na nne ya nọ n'ụlọ oge ọkụ ahụ malitere kwuru na ọ bụ ndị agbataobi bịara dọpụta.

Reuben, onye bị n'Abuja na-agba okada kwuru na kemgbe afọ 2018 bidoro ka ya jiri kpebie ịkpọrọ ndị be ya laghachi obodo ya bụ Amaogbele Ezimo ga birizie mana ọkụ ogbụgba atapịasịala ngwongwo ya bụlatara ụlọ.

Ka ọ dị ugbua, Reuben kọwara na ọ bụ enyị ya nwoke nyere ya ohere ka obirigodu n'ụlọ ya rue mgbe ọ ga ahụ ego ruọ ụlọ ọzọ.

Reuben Okeze na-ayọkwa enyemaka maka ịrụta ụlọ ọzọ n'ihi na ọbụ ịgba ọkada ka ọjị azụ ezi na ụlọ ya.

Ọkụ ụgbọmmanụ agbaala ọzọ na Legọs

Image copyright LASTMA

Ụgbọmmanụ bu mmanụ nwuru ọkụ n'elu akwa dị n'Ifako Bridge dị n'Ogudu dị nso ọjọta.

O nweghị onye ma ihe mere ụgbọ ahụ jiri nwuru ọkụ mana ndị ọrụ okporoụzọ Legos ndị a ma dịka Lastma kọwara na e menyụọla oku ahụ ma bụkwa ụgbọ ahụ gbara ọkụ.

Oku ọgbụgba ahụ butere kpachi kpachi ụgbọala n'ụzọ si Third Mainland Bridge aga Berger.

Ndị ọrụ na mba Zimbabwe ajụla mbulite ụgwọọnwa ha

Ndị ọrụ bekee na mba Zimbabwe ajụla mbulite gọọmenti ha ji pasent iri bulite ụgwọọnwa ha.

Image copyright AFP

Ha si n'orughị ihe ha chọrọ.

Ha chọrọ ka ụgwọ opekatempe ha bụrụ otu puku, narị dọla asaa,irir atọ na atọ.

Ha kwuru na nke bụ iji belata ahụhụ n'ihi oke ihe isi ike dị na mba ahụ.

Zimbabwe nọ n'ezi ihe ụka dịka akụnaụba ha kpụụla afọ n'ala.

Onyeisiala ha bụ Emmerson Mnangagwa na-akwado njem mba gụnyere Russia iji rịọ ndị ojiegoachụego ka ha tinye ego na mba Zimbabwe.

Anyị agaghị egbochi onye ọbụla ibinye aka - MASSOB

Otu MASSOB ekwuola na ha agaghị egbochi nwafọ Igbo ọbụla isonye na ntuliaka nke na-abịa kama na otu ha agaghị eso na ya bụ ntuliaka.

Onyeisi mgbasa ozi ha bụ Samuel Edeson gwara BBC Igbo na MASSOB ka kwenyesiri ike na nwereonwe Biafra site n'usoro udo.

Anyị apụghị ịgwa INEC ihe ga-eme maka Zakari - European Union

Otu European Union n'ụbọchị Fraịde ajụla mkpesa PDP nyere ha n'isi ụlọọrụ INEC banyere ọrụ ha nyere Amina Zakari.

Osote onyeisi nyocha ndị otu a bụ Hannah Robert kwuru na ha enweghi ikike ịgbanwe ihe ọbụla karịa naanị ịtụnye aro.

Na mba Congo

Image copyright Reuters

Martin Fayulu bụ onye e meriri na ntuliaka onyeisiala mba DR Congo aṅụọla iyi na ọ ga-agba akwụkwọ n'ụlọikpe banyere ntuliaka ahụ.

Fayulu gwara BBC na ndị mba ahụ kwesiri ịma nke bụ eziokwu na ntuliaka ahụ nke mpụtara ya tarala isi ọtụtụ mmadụ.

N'egwuregwu

Onye ama ama n'egwugwuregwu Tennis bụ Andy Murray ekwuola na o cheghi na ọ ga-akụli bọọlụ Tennis rue ọnwa anọ na-abịa abịa.

Nwa amadị a ji anya mmiri akwa kwuo nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mgbape egwuregwu Australia Open.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Akpụpụla ndị 'zuru' akpati ego Mugabe ụlọikpe

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ex-President Robert Mugabe was ousted in 2017

Akpụpụla mmadụ atọ ụlọikpe bụ ndị eboro ebubo imaburu akpati ego Robert Mugabe bụ onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe.

Akụkọ kwuru na ndị a ji puku dọla narị na iri ise dị n'akpati ahụ gaa zụọ ala, ụgbọala na ihe ndị ọzọ. Eche na ọ bụ otu ikwu na ibe Mugabe nyere ha igodo ha ji tụghee ụzọ.

Ihe Buhari gwara BBC

Image copyright @Garbashehu/BBC

Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị ntaakụkọ ka ha gbaa mbọ na-agbasa ozi ziri ezi

Buhari kwuru nke a mgbe ya na onyeisi BBC world Service bụ Jamie Angus zutere n'obi gọọmentị Naijirịa dị n'Abuja.

Ọkụ IMSU

Obi wụnyere ndị mmadụ n'afọ ka ọkụ malitere ịgba na ngalaba Faculty Of Humanities nke dị na mahadum Imo State e ji IMSU mara.

Ndị hụrụ ka ọkụ a na-agba kwuru na o nọruru otu awa ma gbarie ihe ndị nọ n'ime ụlọ ahụ a malitere ịrụgharị n'afọ gara aga.

Nafdac anwụchịela ụgbọala bu ọgwụike

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka, na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara maka 'kpoli ndụ'

Ngalaba na-ahụ maka ọgwụ na nri akpọrọ Nafdac, anwụchiela otu gwongworo bu ọgwụike gụnyere kodine, n'ụzọ Oshodi dị na Legọs.

Nafdac kwuru sị na ọgwụ a si Seme dị n'oke ala Naịjirịa na Bene Repọblik bata.

Onye egwuregwu Kongo bụzị onye omeiwu

Image copyright Getty Images

Onye egwuregwu ọzọ abaala ọchịchị, mana ugbua ọ bụzị na mba Demokratik Repọblik nke Kongo.

Robert Kidiaba bụbu aka na-echere ha goolu e ji ịsụ ike n'ala agba egwu ma ndị otu ya nye goolu mara, bụzị onye omeiwu na mpaghara Upper Katanga Province.

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Anyị mụzị anya ugbua'