Osinbajo sị na Buhari amaghị maka mkpụpụ akpụpụrụ Onnoghen ụlọikpe

Akụkọ ndị dị mkpa

Osinbajo: Buhari amaghị maka ịkpụpụ Ọkaikpe ukwu Naijiria ụlọikpe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Yemi Osinbajo onye bụ osote onyeisiala Muhammadu Buhari bụ ọkaiwu nwere agba na Naijiria

Osote onyeisiala Naijiria ekwuola na obi adịghị ya mma maka agwa a kpasoro onye Ọkaikpe ukwu Naijira bụ Jọstịs Walter Onnoghen.

Osibanjo onye kwuru nke a n'ọgbakọ ndị na-ede akụkọ n'igwe okwu intanet ụbọchị Wenezde kwukwara na onyeisiala Muhammadụ buhari amaghị maka ya were rue ụbọchị Satọde.

Cheta na a kpụpụrụ Onnoghen n'ụlọikpe pụrụ iche nke a kpọ®ọ Code of Conduct Tribunal maka ebubo na ọ kọwapụtachaghị ka akụ ya ha kemgbe ọ bụrụ Ọkaikpe ukwu Naijiria.

Ihe mere ọnụ ahịa gbalitere rue pasent 11.44 - Ọkachamara

Image copyright AFP

Ọnụ ahịa ihe na-ada n'ahịa agbalitela rue pasent 11.44 dịka nyocha nke ngalaba ọnụọgụgụ nke a kpọrọ National Bureau of Statistics wepụtara ụbọchị Wenezde maka ọnwa Disemba.

Mgbalite a nke ji pasent 0.16 were karịa nke mere n'ọnwa Nọvemba kachasị ihe ọdịda ọnụ ahịa kemgbe ọnwa asaa gara aga.

Mgbe ikpeazụ ihe dara ọnụ otu a bụ n'ọnwa Mee afọ 2018.

Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Uche Uwaleke kwuru na ọ bụghị ihe kwesiri ime ka ndị Naijiria tụọ uche.

"Ihe kpatara ihe jiri daa oke ọnụ bụ n'ihi na ọtụtụ mmadụ na-azụ ihe maka mmemme Ekeresimesi."

Ụwaleke kọwara n'ihe ndị ego ha gbagoro bụ ihe nrị dịka mmanya ọtọ bịrịbịrị, osikapa, ji, achịcha Bekee, azụ na ihe ndị ọzọ, ihe ndị bụcha ihe ndị mmadụ ji eme emume.

Ụmụ Zimbabwe na-eme ngagharịiwe maka na a manyere ego n'mmanụ ụgbọala

Image copyright Getty Images

Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa onye nọ njem na mba Rụssia akatọla ngagharịwe na mmebi ihe so ya dịka ndị obodo ya na-egosi iwe ha maka ego etinyere na mmanụ ụgbọala na mba ahụ.

Ọ kwuru na ya na-ahazihari obodo ha iji dọta ndị jiego achụ ego, ọbụghị ọgbaghara na tigbu zọgbuo.

N'egwuregwu,

Roger Federer kpụpụrụ Dan Evans

Image copyright Getty Images

Roger Federer emeriela Dan Evans na asompi 'Australian Open' na-aga n'ihu ugbua.

Federere ga-ezutezi Taylor Fritz n'agba nke atọ nke asompi ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara