Lassa Fever outbreak: Iba Lasa adịghị mfe ngwọta-Dokịta

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Oke bụ anụmanụ n'ebu ọria lassa

Dokita ahụike ọha bụ Dr Agunwa akọwala na isi jọrọ ọrịa Lasa njo nke ukwu.

" Ọ na-egbu mmadụ rinne ọ banye gị n'ahụ ọ na-enye nnukwu nsogbu. Ọ na-ahịa ahụ ịgwọta mana "

Mana, "onye nwere lasa gaa n'ụlọọgwu n'oge, a ga agwọtali ya."

Ụzọ ezi enweta ya

Dọkịta Agunwa kọwara n' ọ dị ụzọ abụọ e si ebutekarị ịba Lasa:

  1. Ịgbasa ọka, gari na ngwa nri n'okporoụzọ ebe oke ọhịa nwere ike nyụnye ya mamịrị maọbụ nsị
  2. Site mmiri, ọsịsọ, ọbara, mamiri, nsị, agbọọ na mmiri ahụ onye nwere ọrịa lasa

Kedụ ka ị ga-esi ma inwere ọrịa lasa?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Otu ụzọ esi gbochi ọrịa Lassa bu n'ikpuchite ihe mmadụ na-eri eri.

Ọ naghị ewe anya ị mata onye nwere ọrịa Lasa n'ihi na njirimara ya na-eyi nke ịba ndị ọzọ dịka taifod, ịba wdgz.

Mana Agunwa dụrụ ọdụ ka ị gaa ụlọọgwụ maka nyocha ahụ ma ị hụ ihe ndị na-atụ aka na nwere ọrịa dịka:

3. Mmadụ ịsị na oke arụ na-eme ya ( temperature karịa 38 degrees)

4. O na-eji isiọwụwa ebido

5. Onye ahụ na-agbọ agbọ

6. Ọbara si na mamiri, nsị nakwa na anya onye ahụ na-apụta (nke a na-egosi na ọrịa ahụ akarịala otu izuụka, na ọrịa ahụ eriela ahụ onye ahụ)

Lasa na Ebola enwere nyiri?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

7. Lasa na Ebola nọ n'otu ezinaụlọ, ha abụọ bụ 'vịrọs'

8. Etu ha si egbu mmadụ yiri

9. Mana Ebola ka Lasa njo

Kedụ ihe i kwesiri ime?

10. Gaa ụlọọgwụ ozigbo i nwere njirimara a gụpụtara na 3,4,5 maọbụ 6.