Nigeria Elections 2019: Gịnị ka ị ma gbasara obodo Buhari?

Muhammadu Buhari Image copyright @MBuhari

Daura bụ obodo dị n'ime Katsina steeti dị na mpaghara ugwu Naịjirịa bụkwa ebe a mụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari.

Buhari bikwara ọtụtụ afọ na ndụ ya n'obodo ahụ.

N'ime akụkọ a, BBC na-elebanye anya n'ihe ise pụrụiche achọpụtara na Daura.

1. Akụkọ mbido ya

Anaghị akọ akụkọ mbido ndị Awụsa n'ekwughi okwu obodo Daura.

Ndị kọrọ akụkọ oge gboo na-ekwu na ọ bụ ebe ahụ ka agbụrụ ndị awụsa siri malite.

2. Ihe ndị metụtara Daura

Obodo a dị n'oke ala Naịjirịa na ala Naịja na-ahụ ntaramahụhụ ụfọdụ oge.

Oke ide mmiri nakwa oke ọkọchị bụ ihe abụọ na-enye ya nsogbu. O nweghikwa ụlọọrụ na-arụpụta ihe nke ga-ebute ọrụ nyere ndị mmadụ.

3. Vootu Daura niile a bụ nke Buhari?

Na ntuliaka niile emere nke Buhari zọrọ ọkwa onyeisiala na ya, o meriri na Daura.

Ya bụ 2003, 2011 na 2015 mana ihe ịtụanya mere na 2007 mgbe PDP meriri na ya bụ obodo.

4. Ndị welitere isi na Daura

Image copyright Presidency

Umar Faruk Umar bụ Emir na-achị obodo Daura.

Alhaji Usman Daura bụ onyeisi nchekwa na gọọmentị onyeisiala Shehu Shagari site na afọ 1981 rue 1989.

Sani Zangon Daura bụbụ minista na-ahụ maka ịkọ nri nakwa minista mbara ezi.

Lawal Musa Daura bụbụ onyeisi ndị uweojii pụrụriche bụ SSS n'aha ịchafụ

Ambassador Mamman Daura bụbụ onye nọchitere anya Naịjirịa na mba ndị gụnyere Yuganda, Sawudi Arabia, Sawụt Korea, Belgịọm nakwa Kamerun.

5. Gịnị ka ndị Daura na-atụ anya?

Dịka BBC chọpụtara, ụfọdụ ndị mmadụ chọrọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari gbapee oke Naịjirịa na Naịja iji kwalite azụmahịa n'obodo ahụ.

Ihe ejiri gbachie ya bụ oke na mbụ bụ maka kepu kepu na eji ya ezobata ngwa agha na ngwa ndị ọzọ amachiri amachi.