Ndị meriri ntuliaka 2019 a dị mkpa?

Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala

Ntulika ndị a na-eme na Naịjirịa na-abụ bụ site n'ụdị mmadụ onye bụ karịa ihe ndị dị mkpa metụtara ndị mmadụ.

N'agbanyeghi na ọtụtụ ndị mmadụ sonyerela n'ọsọ ịzọ ọkwa onyeisiala nke 2019, ọ ga-abụ otu ihe ahụ?

Chris Ewokor, onye ọrụ BBC gara n'okporoụzọ ịme nchopụta gbasara okwu ị maata ma onye meriri a dị ndị mmadụ mkpa?

Ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị mmadụ kwụnyere Muhammadu Buhari na Atiku ebe ndị ọzọ kwadoro ndị ọgbara ọhụrụ dịka Kingsley Moghalu nakwa Fela Durotoye.

Ụfọdụ ụmụ nwaanyị kwụsị ike n'azụ Oby Ezekwesili na-ekwu na ọ bụ onye tozuru ime ihe dị na Naịjirịa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption2019 Elections: "Buru anyị n'uche" - Ndị ntorobia

Kemi Diego-Okenyodo kwuru na ọ dị mma ka onye ọhụrụ arụbeghi ya bụ ọrụ mbụ zọta ya n'afọ a.

Otive Igbuzor kwuru na n'agbanyeghi na ihe jisike agbanwe, na ntuliaka a ga-abụ njịkọ ihe metụtara mmadụ nakwa ụdị mmadụ onye bụ.

Onye ọzọ a jụrụ bụ Ernest Ereke kwuru na ezigbo ọrụ dịrị onye ọbụla ga-emeri ntuliaka a n'ihi na ihe niile site na nchekwa, akaụnaụba obodo, ọrụ, njịkọ obodo nakwa nwulite obodo adịghị n'ọnọdụ dị mma.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a