'Ohaneze na-etinye Ndigbo n'ọnya dịka n'afọ 2015'
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Njiko Igbo: Ohaneze na-etinye Ndigbo n'ọnya dịka n'afọ 2015

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwenti, onyeisi otu ahụ bụ Rev Chris Obioha kwuru na ọ bụ itinye Ndigbo n'ọnya ụdị ha dabara n'afọ 2015.

N'okwu ya, ha kwụnyere Goodluck Jonathan, ma e mechaa Buhari merie.

"Ọ bụ ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe kwesiri omume n'ihi na anyị niile nọ n'otu ndọrọndọrọ dị icheiche."

O kwuru na ọ gara aka mma na Ohaneze kwadoro Moghalu na ọ bụghị iji maka Peter Obi kwado Atiku dịka o kwuru na ọkwa osote onyeisiala enweghị ike imere Igbo ihe ọbụla.

N'okwu ya, o kwuru na ọ kara aka mma na onweghị onye ọbụla ha kwadoro iche.

Ọ bụghị naanị Njiko Igbo bụ ndị obi ha adịghị mma na mkpebi Ohaneze.

Onye Igbo ọzọ ọnụ na-eru n'okwu bụ Chuks Ilegbu kwuru na ọ bụ "anyị tinye agịlị anyị n'otu akpa."

Mana na nkọwa ya, onye ndu Ohaneze Bụ Nnia Nwodo kwuru na mmegbu Ndigbo n'aka Buhari enweghị atụ.

N'okwu ikwado Moghalu nakwa ụmụ igbo na-azọ ọkwa onyeisiala, o kwuru na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na anọghị na APC na PDP na-egbu oge ha.