BBCGovDebate: Ndọrịtaụka a ga-enye aka ịkwalite ọchịchị onyekwuoucheya- Ndị Abịa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdọrịtaụka a ga-enye aka ịkwalite ọchịchị onyekwuoucheya

Nrụrịtaụka BBC Igbo n'Abia abịala na njedebe.

Ndị Abịa kwuru na ndọrịtaụka ahụ nke BBC Igbo haziri n'Ụmụahịa, Abia steeti ga-enyere ọchịchị onyekwuouche ya aka na steeti ahụ.

Lee ụfọdụ ihe ekwuru i kwesiri ịma:

ALEX OTI (APGA)

  • A ga m eleba anya na-etu steeti Abịa siri jide ụgwọ karịrị otu narị ijeri naịra
  • A ga m akwụ N36,000 dịka ụgwọ ọnwa opekatampe
  • A ga m arụ ụzọ, wulite mmepụta ọkụ Latrịk, ma kpochaa Aba ka ọ dị ọcha
  • A ga m eme ka enwee ezi mkparịtaụka dị n'etiti gọọmenti nakwa otu IPOB iji gboo nsogbu ha.

Gịnị mere ndị ndọrọndọrọ ji agbahapụ nrụrịtaụka?

BLESSING NWAGBA (SDP)

  • A ga m akwụ N50,000 dịka ụgwọ ọnwa opekatampe
  • A ga m ahazigharị ọnọdụ ndịọrụ i ji mee ka ha rụsie ọrụ ike
  • A ga m arụgharị ụzọ dị n'Aba iji kwalite mbawanye ụlọọrụ
  • A ga m etinye n'ọrụ, iwu ndị ahụ ewepụtara maka ọdịmma ndị ọrụsị.

Uzodimma, Ihedioha na Ararume abịaghị nrụrịtaụka BBC Igbo

JOSEPH NKORO (YPP)

  • A ga m e ji unyi maọbụ ureghure nọ 'Aba nweta ikike ọkụ
  • A ga m ekewapụta ogbe obibi ọgbaraọhụrụ n'ime ọgbọnta vootu atọ na steeti Abịa
  • A ga m ekewapụta ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ndị dị mkpa iji nyere ndị ọrụsị aka
  • A ga m ekewapụta ụlọakwụkwọ ga na-ahụ maka ọzụzụ akaọrụ nakwa ọrụugbo iji nye ndị ntorobịa ọrụ.

CHUKWUEMEKA UWAKOLAM (ACCORD)

  • A ga m akwụ N30,000 nakwa ego mkpọnye aka ndị ọzọ nye ndịọrụ n'oge
  • A ga m arụzigharị okporoụzọ Aba iji mee ka ọnọdụ akụnaụba tụtegharịa
  • A ga m etinye n'ọrụ, ego mmanụ niile batara na steeti Abịa iji mee ka ndị mmadụ kute ume ndụ
  • A ga m atụtegharị ọnọdụ egwuregwu.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a