Agwọ atụọla nwanyi n'ike n'ulo mposi

Ebe mmadụ na-esepụta agwọ n'ime mposi Image copyright JASMINE ZELENY
Nkenke aha onyonyo Ha kpọkuru onye maara anya agwọ ka ọ bịa wepụ agwọ ahụ

Otu nwaanyị bu aka n'otele ka agwọ tụrụ ya ebe ọ chọrọ ịga mposi n'ụlọ, n'Ọstrelia.

Dịka onye wepụtara agwọ ahụ si kwuo, Helen Richards dị afọ 59, chọrọ ịga mposi n'ụlọ otu onye ezinaụlọ ya ọ gara ileta, oge agwọ ahụ selitere isi wee tụọ ya ka ọ bụ onye o ji ụgwọ.

N'ihi na agwọ ahụ enweghi elo n'ime ahụ ya, ihe a gwọrọ Richards bụ naanị ebe eze agwọ ahụ tụpuru.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị "otu ihe metụtara m ka m tukwuru ala, m malie elu ka mmọnwụ a na-akwa aka, peteri m wụsa n'ala, m wee hụ ihe yiri mbe olu ya toro ogologo ka ọ na-amaghachị n'ime mmiri."

Image copyright Jasmine Zeleny
Nkenke aha onyonyo Jasmine Zeleny bụ ọkachamara n'ihe gbasara agwọ, kwuru na ọ bụ mmiri bubatara agwọ ahụ n'ụlọ mposi ahụ

Jazmine Zeleny bụ onye nwụchiri agwọ ahụ kwuru sị na ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ agwọ n'ime mposi ọkachasị oge ihuigwe dị ọkụ, makana agwọ ga na-achọ ebe mmiri dị.

O kwukwara na ọ bụ ụjọ mere agwọ ahụ ji makwasị Richards, makana ọ nọchiri ebe o kwesịrị isi pụọ.

Agwọ ndị a akpọrọ "carpet snake" anaghị enwe elo, mana ndị ọkachamara na-akọwa na ọ na-aka mma ịgba ọgwụ tetanụs iji gwọọ onye ọ tụrụ.

O nweela oge oke ọkụ ihuigwe gburu ọtụtụ ịnyịnya, ụsụ nakwa azụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara